Nnọọ n´obodo Austria!

Foto onyoonyoo: Schlosspark Schọnbrunn ya na Gloriette. Ugwu ji nwayo na-agbago nke ahịhịa n´osisi juru n´ime ya. N´eluelu ugwu k´ụlọ Gloriette ahụ nọ, ụlọ nke pila iri n´otu jigidere. Tupu erute ụlọ ahụ, a ga-ahụ ọtụtụ ndị mmadụ.

Achọpụtara n´isi obodo ọzọ, nke anọghị niime Europe m´ọbụ niime Switzerland, bata. Ị chọkwara iji obodo Austria mere ebe obibi gị.  Obi dị anyị ụtọ maka anya ịhụrụ obodo anyị, anyị ji obi anyị na-asịkwa gị nnọọ.

Iji wee nọọ nke ọma n´obodo ọhụrụ gị, mmadụ ga-amarịrị iwu na ihe ndị ọzọ dị mkpa e nwere n´obodo ọhụrụ ya bụ Austria. Nke a mere anyị ji depụtere gị iwu ndị a niile nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa i kwesịrị ịma, n´ebe a.

FS Easy Way: Ụzọ dị nso (nkenke) iji nweta ozi m´ọbụ ọkwa dị mkpa.

fs-easyway.at ga-eme ka i nweta ozi si n´ụlọọrụ ndị ọchịchị na-ahụ maka Ọrụ, Ahụisiike, Ọzụzụ (Ụlọ-Akwụkwọ), Ndị-Enyemaka, Ụlọ-Obibi na Ụlọọrụ ndị nwe obodo. Mgbe ọbụla, akwụkwọ ọgụgụ newspaper a na-akpọ Wissen und Werte na-edepụta ihe bara uru dị iche iche mmadụ nwere ike isi n´obodo Austria e nweta, ọ na-edekwa maka etu esi a kpachapụrụ ugwu dịịrị mmadụ anya nakwa uru ọ bara mmadụ ị mata ihe ndịa niile mgbe ọ bịara ọhụrụ.

Mgbe ị batachara n´obodo Austria, e nwere ihe nde dị iche iche ị ga-emerịrị.

N´ebe a ka ị ga-apị aka iji mata ihe mbụ (izizi) ndị a.

Pịa n´ebea ka ịgụọ ihe ndị ọzọ gbasara Easy Way na otu Fair und Sensibel Ọsterreich.

Were akara office@fairundsensibel.at degara ndị otu `Fair und Sensibel Ọsterreich´  akwụkwọ maka ajụjụ ndị ọzọ i nwere ịjụ.

 


Ihe esere ese: Eji ihe dị oji dee OIF. N´elu `O´ esere maakị uhie-uhie na makị na-acha ọcha na makị na-acha ọbara ọbara ọzọkwa. N´akụkụ ya ka-edere n´out out Austrian Integration Fund.

N´ebea eji ihe odide ọcha see mmadụ ise, ndị nke ihe na-acha uhie uhie gbara okirikiri.  Ejikwa ihe odide uhie-uhie dee: bmask. N´okpuru ebea ka-eji ihe na-acha nzu nzu wee dee: Ministry na-ahụ maka Ọrụ, Enyemaka (nlekọta ndị chọrọ enyemaka) nakwa Ihe oriri.

Eji ihe na-acha nzu nzu dee: BM.I, n´okpuru ya, eji ihe odide nzu nzu dee: Ministry na-ahụ maka ime obodo. Eji ihe odide nzu nzu see egbe, nke eji ihe odide uhie-uhie see `coat of arms´ n´etiti obi ya.Akwụkwọ asambodo. Esere n´lu ya: Rose flawa nke nọ n´elu ihe na-acha ndụ ndụ. N´okpuru ya, ebe n´eji oji ka-eji ihe ndị odide na-acha odo odo, oroma na ọcha, wee jikwa ihe na-acha ọcha dị icheiche dee: Fair und Sensibel Ọsterreich. N´akụkụ ya ka-esere Austrian Flag.Ịgba egwu n´acha ụlọụlọ (ajaaja - braun). Eji ihe odide na-eji oji, wee see ihe ọgụgụ egwu anọ. N´okpuru ya ka-eji ihe na-acha ọlaedo dee: Ghana Minstrel Choir.