Ihe gbasara Ahụisike

Ihe esere ese: Esere ihe Dọkịta na-akwụnye n´antị, nke oji ege ihe n´eme n´ime ahụ. Apịajiri eriri ya,  nke na-acha uhie-uhie, n´udi nkpụrụ obi mmadụ. Eriri na-acha ọcha dị n´etiti ya. Ha chọrọ igosi ihe na-acha uhie-uhie, nakwa ọcha-ọcha, nakwa ụhie-uhe ọzọkwa.

E nwere ihe abụọ bịakọrọ ọnụ n´ihe gbasara Ahụisike n´obodo Austrịa, ha bụ ndị ụlọrụ obodo nakwa ndị otu dị icheiche: ewepụ ndị ọchịchị obodo Austrịa (Parliament), nakwa ndị Ministry na-ahụ maka Ahụisike ndị mmadụ, nakwa ndị Ministry na-ahụ maka ọrụ, ọdịmma ndị mmadu nakwa ihe oriri, enwekwara ndị ụlọrụ Austrịa na-ahụ maka nchekwa ọdịmma ndị mmadụ (social security), nakwa ndị otu na-ekwuputere ndịọrụ ọnụ ha, nakwa ndịọrụ n´onwe ha.

Enwere nnukwu ụzọ ihe abụọ dị iche n´ihe gbasara Ahụisike: Ụlọgwụ bụ nke mbụ, nke abụọ bụ nlekọta ndịọrịa n´ebe na-abụghị ụlọgwụ. Iwu gbasara nke a dị isi obodo n´aka, mana iwu na mmejupụta iwu n´ihe gbasara nlekọta n´ebe ndị ọzọ na-abụghị ụlọgwụ, dị n´aka ndị `State´.

A na-enweta ego eji akwụ ụgwọ ihe gbasara Ahụisike site n´ụtụ na onyinye ndị mmadụ na-enye ndị ulọrụ na-ahụ maka nchekwa ọdimma ndị mmadụ, sitekwa n´ụtụ taị na sitekwa n´ego a na-akachapụ n´ụgwọ ọnwa (ọrụ) mmadụ. Ọ bụ iwu n´onye ọ bụla na-arụ ọrụ nakwa ndị na-arụrụ onwe ha ọrụ, ga-enwerịrị mkpuchi nke a na-akpọkwa `insurance´. A ga-ekpuchi ha (insurance) n´ihe gbasara ọrịa, ihe mgberede nakwa ezumike nka (retirement). Ọ bụ ndị ụlọrụ mkpuchi (insurance) ga-ekwu ma ha ga-ekpuchikwa ihe gbasara ezumike nka. Ndị na-arụrụ mmadụ ọrụ agaghị enwe ike iji aka ha họrọ ụlọrụ mkpuchi ha chọrọ, kama ọ bụ ndị kpọrọ ha n´ọrụ k´ọdị n´aka, oge ụfọdụ, ọ na-esite n´akụkụ obodo mmadụ nwetara ọrụ. Mana ndị na-arụrụ onwe ha ọrụ nwere ike iji aka ha họrọ ụlọrụ nke ha chọrọ.

Onye ọ bụla bi n´obodo Austrịa nwere Ike (Right) inweta ụdị enyemaka ọ bụla ọ chọrọ mgbe ojighị ahụ.

Lee ebe edere ihe gbasara Austrian Social Security n´asụsụ dị icheiche.

 

Quelle: BMG