Ihe ndị mmadụ kwesịrị ịma tupu ọhụ Dọkịta

Ihe esere ese: Dọkịta nwanyị nọ n´ime ụlọ ebe a na-ele onyeọrịa ahụ.

  • Tupu i kulie ije ịhụ Dọkịta, ngị na ya yie agba.
  • Ọtụtụ ndị Dọkịta ga-esị gị kwụọ ha ụgwọ m´ọbụrụ na imeghị ka ha mara ọsịịsọ n´ịgaghị enwe ike ịbịa (awa 24 tupu oge unu yiri agba eruo). Mee k´onye ngị na ya yiri agba mara ọsịịsọ mgbe ọ bụla ịgaghị enwe ike ịbịa.
  • Jide e-card gị mgbe ọ bụla. Ị ga-adị nkwadebe ime ka-amara akara ọgụgụ edere na e-card gị, mgbe ọ bụla ichefuru ya. Enwere ike ịgwa gị k´ịdebe ego na nke ha ruo mgbe i wetere kaadị gị. Emechaa ị ga-ewetere ha e-card ahụ werekwa ego i debere.
  • Ị ga-eji akwụkwọ, nke onyoonyoo gị dị n´ime ya, nke eji ama onye ịbụ (ID Card), ka-ewere ya lee m´ọbụkwa gị nwe e-card ahụ.
  • Were akwụkwọ ochie niile na-egosi ihe achọpụtara n´ahụ gị, mgbe mbụ ị na-eje ịhụ Dọkịta.