Mkpuchi ugwọ Ụlọgwụ (health insurance coverage) nakwa Ego nlekọta ahụ

krankenversicherungNEU-01

Mkpuchi ugwọ Ụlọgwụ (health insurance coverage)

Ụlọrụ Austrịa na-ahụ maka ikpuchi (insurance) ụgwọ ụlọgwụ mmadụ, kwere nkwa na ha ga-akwụ ụfọdụ ụgwọ ụlọgwụ nke onye ọ bụla debara aha ya n´ụlọrụ ha kwseịrị ịkwụ.

E nwere udi ụzọ mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ (health insurance coverage) abụọ: mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nke iwu kwuru n´onye ọ bụla ga-emerịrị nakwa mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nkeonwe (private health insurance).

Mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nke bụ iwu (health insurance coverage)

Mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nke iwu kwuru n´onye ọ bụla ga-emerịrị agbasaghị naani ndị na-arụrụ mmadụ ọrụ, kama ọ gbasakwara onye ọbụla na-arụrụ onwe ya, nakwa ndị nwe ebe mmadụ na-arụ ọrụ.

Ewepụ ụdị mmadụ ndị nke a, iwu kwukwara na-aga ekpuchị (health insure) ndị niile enweghị ọrụ, ndị nke obodo na-enyere aka ego, nakwa ndị niile nọ ezumike nka, ha na ndị ezinụlọ ha (dịka ọnọdụ ha siri dị).

Ndị a ga-ekpuchi (insure) dịka ndị ezinụlọ ha bụ:

  • Di na Nwunye nakwa ndị bi n´otu ọnụlọ dịka Di na Nwunye, ha ga-egosị ihe akaebe
  • Ụmụaka erubeghị afọ 18
  • Ụmuaka enweghị ọrụ ruru afọ 21
  • Ụmụaka ruru afọ 26, mana ha ka na-agụ akwụkwọ

Ọ bụghị ihe niile ka Mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ (health insurance coverage) ga-enwe ike ikpuchiri gị, nke pụtara n´onwere ihe ndị ọzọ gbasara ahụike mmadụ nke onye ejighị ahụ ga-eji aka ha kwụọrọ onwe ya kpam kpam m´ọbụ kwụọ sọọsọ ụfọdụ n´ime ha (ihe ndị dịka igote na ịkwanye eze ọhụrụ) 

O nwere obere ego nkwado iwu kwuru n´onye ọrịa ga-akwụ m´ọbụrụ n´owere akwa (bed)  n´ụlọgwụ.

Mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nkeonwe (private health insurance coverage)

Mmadụ nwere ike iji aka ya kpuchiere onwe ya ụgwọ ụlọgwụ ya. Mgbe mmadụ mere nke a, a ga-enyere ya aka kpuchie ụmụ ihe ụfọdụ ndị ọzọ, ndị iwu kwuru na-aga ekpuchirịrị.

Ụgwọ (Ego)

Ọtụtụ ndị Dọkịta na ndị ụlọrụ na-ahụ maka mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ, nwere nkwekọrịta ha nwere gbasara etu a ga-esi akwụ ndị Dọkita ụgwọ akaọrụ ha. N´ọtụtụ mgbe, ndị Dọkịta anaghị ana ndị ejighị ahụ ego ọzọ ọ bụla.  Ewezugara ndịọrụ dịka ndịọrụ obodo (civil servants) na nke a.

Ndị ejighị ahụ ga-eji kaadi E-Card mgbe ha na-eje ịhụ Dọkịta. Akwụkwọ ahụ, nke dịka akwụkwọ cheki eji ewere ego n´ụlọ akụ, nke ndị na-enye ya bụ ndị ulọrụ na-ahụ maka nchekwa ọdimma ndị mmadụ (social security), gbanwekwara akwụkwọ nkịtị nke mbụ ha na-enye ndị mmadụ. Ọ bụ naanị E-Card ka a na-eji agbakọ ụgwọ nlekọta ahụ.

Ndị Dọkịta, ndị ha na ndị ụlọrụ na-ahụ maka mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ (health insurance companies), enweghị nkwekọrịta, ga-anara ndị ejighị ahụ ego ụgwọ aka ọrụ ha ozigbo. Ndị ejighị ahụ nwekwara ike itinye akwụkwọ na nke ndị ụlọrụ na-ahụ maka mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ (health insurance companies) ka akwụghachi ha ụgwọ ụfọdụ ha kwụrụ. N´ọtụtụ oge, nke a na-enwe isi. A na-akpọ udi ndị Dọkịta ndịa `choice Doctors´.

Mkpuchi ụgwọ ụlọgwụ nkeonwe (private health insurance coverage) na ekpuchi ọtụtụ ụgwọ nlekọta.

A ga-akwụ (2015: € 5,55) maka otu ọgwụ ọ bụla edepụtara n´akwụkwọ eji anara ọgwụ.

 

Quelle: BMASK/BM.I

 

Links