Ịgụ akwụkwọ maka ndị okenye

Ihe esere ese: Esere onyenkuzi nọ n´ime klasị ya n´ihu blakbọd. Mmadụ atọ nọ ala n´oche nọ n´ime klasị.

Ndị na-eji ohere enyere ndị okenye ịgụ akwụkwọ kpọrọ ihe, bụ ndị mmadu, ndị nke gụchara akwụkwọ nke mbụ, nke iwu kwuru na a ga-agụrịrị. Ndị mmadụ ndị a bụkwa ndị chọrọ ịzụlita onwe ha n´akwụwkọ karịa.

Ewepụ obere ihe ọmụmụ ndị ọzọ dị icheiche, ndị nke a na-akuziri ndị okenye dịka ha siri chọọ, ha nwekwara ike iji ohere ahụ gụchapụ akwụkwọ nke ha hapụrụ ịgụ mgbe ha bụ ụmụaka.

Enwere udi ịgụ akwụkwọ maka ndị okenye dị icheiche nakwa ohere dị icheiche a na-enye maka ịgụ udi akwụkwọ nke a. N´ọtụtụ oge, ọ bụ ndị okenye ndị nke na-arụ ọrụ, na-eme ka amara na ha chọrọ inweta ihe ọmụmụ nke a ga-akuziri ha.

Ịgụ akwụkwọ maka ndị okenye bụkwa ihe a na-akpọ `ije akwụkwọ mmụtakwu´(further education), nke a dịkwa iche n´ebe `ije akwụkwọ mmụtakwu´ udi nke ọzọ dị. Mmadụ ibidokwa ịgụwanye akwụkwọ, m´ọbụ ịga n´ihu ịmụwanye akaọrụ site n´ebe ọ kwụsịrị  n´ambụ, bụ udi akwụkwọ nke ọzọ a na-ekwu okwu ya.

Obodo Austrịa nwere ọtụtụ ndị ụlọrụ ndị nọọrọ onwe ha, nakwa nke ndị obodo, ndị enyefere ịgụ akwụkwọ maka ndị okenye n´aka.

 

 

Links