Ịmụ Asụsụ German

NEUdeutschlernen-01

Imụta asụsụ obodo dị oke mkpa maka mmadụ inweta ezigbo ọnọdụ n´obodo. Ịsụ otu asụsụ bụ ihe na-akpọkọta mmadụ niile ọnụ, bụrụkwa ihe na-enye aka iji merie nsogbu a na-enwe n´ụlọrụ.

Ndị obodo Austrịa, a na-ebido mgbe nwatakịrị dị afọ 3 kuzibere ya etu esi asụ asụsụ German. Ọ bụ ndị obodo na-akwụ ụgwọ maka ịkuziri ụmụaka ndị nke n´erubeghị ogo ije akwụkwọ, asụsụ German. Nke a bụ etu ụmụaka, ndị nke asụsụ ejiri mụọ ha abụghị German, ga-esi mụta asụsụ German ngwa ngwa. Nke a na-enye nnukwu ohere mgbe mmadụ ga-achọ ịgụ akwụkwọ, m´ọbụ chọọ inweta ọrụ.

Nkwekọrịtara maka inye ọnọdụ n´obodo, nke ndị niile si obodo ọzọ bịa kwekọrịtaara, kwuru n´iwu ji ha igosi akwụkwọ ha jiri gụọ asụsụ German. Ndị obodo Europe nwere ụzọ ịmụ asụsụ German abụọ ha kwadoro:

Uzọ nke mbụ (Modul 1) bụ maka mmụta asụsụ German wee ruo n´ogo nke A2, nke a ga-enweterịrị tupu afọ abụọ a gafee.  Uzọ nke mbụ (Modul 2) bụ maka ndị chọrọ akwụkwọ obodo nke na-adịgide ruo ebighị ebi (permanent residence), nakwa maka ndị na-achọ akwụkwọ Amaala (citizenship). A ga-achọ akwụkwọ mmụta German nke ruru ogo B1 maka nke a. Enweghị oge enyere ruo maka nke a.

Ndị mmadụ na-eji aka ha akwụ ụgwọ maka nke a. Mana ọ bụrụ na mmadụ enwee ike gụchaa akwụkwọ nkea (tupu ọnwa 18 a gafee), a ga-enyeghachi ya ọkara (50%) ego ọkwụrụ. Ego a ga-enyeghachi ya, agaghịkwa akarị €750.

Ndị Ụlọrụ obodo na-ahụ maka nnabata ndị ọbịa, nke a na-akpọ Ọsterreichische Integrationsfonds (ỌIF) bụ ndị nchịkwa, ile ule na ịkwụ ụgwọ dị n´aka.

Enwere ike ịgụ akwụkwọ maka asụsụ obodo n´ampara Austrịa niile nakwa n´obodo ndị ọzọ. Enwere udi dị icheiche. Mgbe ị ga-apị n´igwe Internet ndị ỌIF, ị ga-enweta ozi nnukwu gbasara ịmụ asụsụ n´obodo ị nọ n´ime ya, nakwa n´obodo ndị ọzọ.

 

Quelle: BM.I/Polizei

 

 Links