Ihe mmadụ kwesịrị ịma na uru ha bara

Foto Onyoonyoo: Sebastian Kurz, Minister na-ahụ maka nnabata ndị ọbịa, na-ahụkwa maka ihe na-eme n´Europe nakwa mba ndị ọzọ dị icheiche

Foto: Felicitas Matern/feelimage.at

Ebe a ga-akọwara gị usoro iwu dị icheiche nke emere maka ndị mmadụ niile bi n´obodo  Austria.  Ọ ga-arụtụ ohere dị icheiche aka, nke obodo Austria na-enye gị na ụmụ gị. Ọ ga-akọwapụta udị ibi ndụ dị mma nke ndị Amaala obodo Austria na-anabata.  Ọ ga-arụtụ aka ebe dị icheiche mmadụ nwere ike ije, ebe ya na ndịọzọ bi n´obodo Austria nwere ike ịhụkọrita ma kwụkọrịta okwu.

Enwere m olile anya na obibi gị n´obodo Austria ga-aga nke ọma. E wepụ ị mụta ihe iwu kwuru na idobe iwu ndị obodo Austria, mmụta asụsụ German nke ha na-asụ bụ ihe mbụ kacha mkpa. Ọ bụ okwu German ga-enyere gi aka mgbe ị na-eje na nke ndị ụlọrụ dị icheiche nke ndị nwe obodo Austria nwe, na mgbe ị nọ n´ụlọrụ gị, na mgbe ị nọ n´ụlọakwụkwọ gị, na mgbe ị nọ n´ụlọgwụ,  nakwa ụbọchị niile gị na ndị mmadụ ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta.

Ezigbo mmụta asụsụ German bụ ihe mbụ nwere ike i nyere gị aka mgbe ị ga-achọ ibido ịrụ ọrụ n´obodo Austria. Ọ bụrụgodị n´inwere ike ịkpata ihe ngị na ezinụụlọ gị ga-eri site na-imepe ọrụaka nke gị, ọ bụ (asụsụ ha) nke a bụ ihe mbụ ga-eme ka ha nabata gị nke ọma, bụrụkwa ihe ga-enyere gị aka nnukwu.

I nwere ohere i banye n´otu dị mma dị icheiche e nwere n´obodo Austria. Gbaa mbọ ịhụ n´iji obi gị nabata ma kwanyere ndị Amaala obodo Austria ugwu dịịrị ha, dịka ha siri nabata ma kwanyekwara gị ugwu.  Were ohere e nyere gị na ụmụaka gị ịgụ akwụkwọ n´obodo Austria kpọrọ ihe.

Ndị Austria anaghị agbakọ obodo mmadụ si pụta kama ihe onye ahụ nwere ike imepụta.  Anyị na gị g´abụ ndị mmeri mgbe i mejupụtachara ihe niile achọrọ gị n´aka, nke ga-eme ka gị na ndị Amaala bụrụ otu. Ị ga-esi n´ụzọ nkea rita uru. Obodo Austria ga-eritekwa uru n´aka gị. Nkea bụkwa isi ihe kacha mkpa anyị na gị chọrọ i nweta. Nnọọ n´obodo Austria, ndeewo!

                                                                                                                                                                           Sebastian Kurz

Minister na-ahụ maka nnabata ndị ọbịa, na-ahụkwa maka ihe na-eme n´Europe nakwa mba ndị ọzọ dị icheiche