Asụsụ German na Mmụta (Nzụlite)

Ihe esere ese: Esere akwụkwọ emepere emepe. N´okpuru ya, e nwere ihe atọ eji ihe odide n´acha uhie-uhie nakwa ocha-ocha see.

Asụsụ

Asụsụ Obodo bụ German

Ọ bụ asụsụ German ka a na-asụ n´obodo Austria. Ezigbo mmụta asụsụ German bụ ihe mbụ nwere ike i nyere gị aka mgbe ị ga-achọ ibido ịrụ ọrụ n´obodo Austria, nyekwara gị aka ime ka ndị Amaala nabata gị nke ọma.

Asụsụ ndị ọzọ ndị mmadụ na-asụ

Iwu chekwakwara ma nabatakwa asụsụ ndị obodo ndị ụfọdụ ndị ha n´obodo Austria bụ otu kemgbe ochie (kemgba gboo). Nke a mere a ga-ahapụ asụsụ ala sụọ asụsụ ndị ọzọ ndị nke a n´akụkụ obodo ọ bụla iwu nabatara nke a dịka n´ime ụlọrụ ndị nwe obodo nakwa n´ụlọakwụkwọ (asụsụ ndị Croatia, Slovenia na Hungary).

Ass German b maka onye bla

Onye ọ bụla bi n´obodo Austria kwesịrị ịmụ asụsụ German, onye ọ bụla kwesịrị ịma otu esi asụ ya nke ọma. Ọ na-enye ụmụaka ndị amaghị etu esi asụ asụsụ German nke ọma nnukwu nsogbu mgbe ha na-achọ i bido ịgụ akwụkwọ n´obodo Austria. ọ dị mkpa nnukwu na mmadụ mụtara asụsụ German maka ọ ga-enyere ya aka mgbe e nwere ihe mgberede, m´ọbụ ihe gbasara Ahụmgbu, nakwa n´inyere ụmụaka aka n´ụlọ ime ihe ụlọakwụkwọ ndị Nkuzị sịrị ha mee n´ụlọ.

Obodo Austrịa ga-erite uru n´aka ndị ọbịa ma etu esi asụ asụsụ ndị ọzọ na-agbanyeghị asụsụ German ha ma asụ. Onye n´asụ asụsụ dị icheiche nwere nnukwu ohere ị chọta ọrụ. Ndị ụlọrụ dị icheiche na-ebu ụzọ kpọrọ ndị ma asụ asụsụ dị icheiche n´ọrụ tupu ha akpọrọ ndị nke ọzọ, ọkacha mkpa, m´ọbụrụ na ndị ụlọrụ ahụ nwere akụkụ ụlọrụ ha dị n´obodo ọzọ ma nwekwaa ndị na-azụ ha ahịa si obodo dị icheiche na-asụkwa asụsụ dị icheiche.

Mmta

Mmta (Nzụlite) na-eweta ndma

N´obodo Austria, mmụta dị mkpa nnukwu maka ọ na-enyere mmadụ aka ịzụlite onwe ya, ọ na-enyerekwa mmadụ aka ịbụ onye ọ chọrọ ịbụ (onyeukwu m´ọbụ onyenta). Ọ bụ mmụta na-enye mmadụ nnukwu ọkwa, ego na ndụ ọma n´obodo Austria.

Mmta (Nzụlite) b maka onye bla

E nwere ebe na udị Mmụta dị icheiche, dịka Mmụta nke mbụ (primary), Mmụta nke ọrụaka dị icheiche na Mmụta nke Mahadum (University). E nwere ebe ndị Okenye na-eje gụọ akwụkwọ nke ha hapụrụ (m´ọbụ nke ha jụrụ) ịgụ mgbe ha dị ntakịrị, akwụkwọ nke iwu kwuru na ha ga-agụrịrị. Ụlọakwụkwọ dị icheiche nke obodo nwe, nwere ohere dị icheiche n´ime ya ebe mmadụ nwere ike ị nọ nweta Mmụta karịrị nke o nwere na mbụ. Onye ọ bụla bi n´obodo Austria nwere ohere i nweta udị Mmụta ọ bụla ọ chọrọ, na-agbanyeghị obodo osiri bịa, m´ọbụ udi ndụ ọ na-ebi, m´ọbụ ihe gbasara enweghị ego.

O nweghị onye a ga-egbochiri ụzo i nweta udi Mmụta ọ bụla ọ chọrọ i nweta.

Enyemaka nd Nne na ndị Nna

A na-enwe ụbọchị ndị Nne na ndị Nna na-enwe Nzukọ n´ụlọakwụkwọ ọtaakara (Kindergarten) nakwa n´ụlọakwụkwọ nke mbụ (Primary) ndị nọ n´obodo Austria. N´udi ebe a ka ha ga-anọ mata onwe ha, ma nweta ozi dị mkpa dị icheiche. A na-eji obi ụtọ anabata ndị Nne na ndị Nna ọ bụla bịaranụ. Ị na-enyere nwa gị aka mgbe ị na-aga udi nzukọ nke a.

Iwu dị na Mmta (Nzụlite)

Ọ bụ Mmụta na-ekpebi ụdị ohere mmadụ ga-enwe n´ịchọta ọrụ, nke a ga-ekpebi udi ọnọdụ mmadụ ga-enwe n´etiti ndị mmadụ ibe ya. Obodo Austria na-ebido ngwa ngwa n´ihe gbasara ọzụzụ: ọ bụ iwu na nwata ruru afọ ise ga-ebidorịrị akwukwọ nke ọtakara. Ọ bụ iwu na nwata ọ bụla ruru afọ isii ga-ejerịrị akwụkwọ nke mbụ (Primary/Secondary), nke ọ ga-eje afọ itoolu (iteghete/itenaanị). Iwu ije akwụkwọ nke mbụ a dịịrị nwata ọ bụla ji obodo Austria mere ebe obibi ya, na-agbanyegị nwafọ obodo ọbụ. A ga-ata onye ọ bụla ahụhụ nke na-egbochi nwa ya ịga ụlọakwụkwọ.

Uru lakwkw bara

Uru ụlọakwụkwọ bara bụ ime ka mmadụ mara na onye ọbụla ha etu n´ime iwu, ike mmadụ nwere ikwupụta ọnụ ya, na inyere mmadụ ibe ya aka, na ịhụ n´udo dị, na nkwụba aka ọtọ, ya na inwe obi dị mma na ị nabata atụmatụ ndị mmadụ ọzọ. A na-ele anya na ụmụaka ga-eji ihe ha mụtara n´ụlọakwụkwọ etopụta bụrụ ndị ezigbo mmadụ nwere obi umeala.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.