Ịgba-Mbọ na Ahụisike

Ihe esere ese: Eji ihe odide uhie-uhie see ebe a na-agba ọsọ nke eji ihe odidide n´acha ọcha kabichie ogolo ogolo. Esere mmadụ abụọ na-agba ọsọ n´elu ya.

gba-Mb

Ndụọma site n´ịgba mbọ

Austria so n´otu obodo ndị kacha nwee ego n´ụwa. Nke a bụghị ihe ịtụnanya: ihe butere nke a bụ na ndị mmadụ bi n´obodo Austria gụrụ akwụkwọ, jikwa ọrụ ha kpọrọ ihe. Nke ọzọ bụ maka udo nke n´achị n´obodo Austria.

Ihe gbasara gba mb

Ike inwere na mbọ ị gbara iji nweta ezigbo ọrụ, kpata ezigbo ego maka gị na ezinụụlọ gi, ya na unu iji ohere ịgụ akwụkwọ kpọrọ ihe, ga-enyekwara obodo Austrịa aka ị gawanye n´ihu karịa. Olili anya dị otu a ka obodo Austrịa chọrọ n´aka onye ọ bụla bi n´ime ya. Ihe ndị a bụ ihe ndị na-egosị na mmadu n´ebi ezigbo ndụ n´obodo Austria.

Mmad n n´otu rụ akwụghịụgwọ

Ọtụtụ ndị mmadụ bi n´obodo Austria nọ n´otu dị icheiche ebe ha na-arụ ọrụ akwụghịụgwọ, otu ndị dịka `Red-Cross´ m´ọbụ ndị Mgbanyụọkụ (Fire Service). Ọ bụghị naanị na mmadụ na-esi n´otu dị otu a nweta ndị enyị ọhụrụ kama ọ na-enyekwa aka mgbe mmadụ na-achọ ọrụ ọhụrụ. Ụdị ọrụ ndịa na-enyere mmadụ aka ị mụta ihe ọhụrụ dị icheiche, ndị na-ewe mmadụ n´ọrụ na-ewere onye ahụ dịka onye siri ike n´ọrụ nakwa onye e nwere ike ịtụkwasị obi.

Mmad ilekta ma kpachapr ibe ya anya

N´obodo Austria, ewepụ ịgba mbọ mmadụ na-agbara onwe ya, ihe ọzọ dị mkpa bụ ihụ na mmadụ niile ha otu. Ha na-enyere ibe ha ndị na-enweghị ọrụ, m´ọbụ ego aka. Anaghịkwa e megide ndị mmadụ ndị ahụ ha ezughị oke.

 

Ahụisike

lgw (ebe nlekta ah) nwere ntkwasobi

Mmadụ iji ahụ na-enye ańụrị na obiụtọ pụrụ iche nke na-enyere ndụ aka. Austria nwere ụzọ na usoro nlekọta ahụ  pụrụ iche karịa ndị ọzọ n´ụwa niile. Nke a mere onye ọ bụla bi n´obodo Austria nwere ike i nwete ezigbo enyemaka n´ụlọgwu nke ndị nwe obodo mgbe ọ bụla ọ jighị ahụ.

gw (Ego) ntakịrị

Onwere obere ụgwọ iwu kwuru na mmadụ niile bi n´obodo Austria ga-akwụ iji wee kwadoo ụlọgwụ ha dị icheiche. N´agbanyeghị nke a, onye ọ bụla bi n´obodo Austria kwesịrị inọ ọnọdụ ma mee ihe ndị ga-enyere ya aka k´obie ndụ ogologo.

Ebe mbụ mmadụ ga-eje

Mgbe mmadụ ejighị ahụ, ọ ga-ebu ụzọ jee na nke Dọkịta nwoke m´ọbụ nwanyị ọ bụla nwere ebe nlekọta ahụ nke aka ya. Mgbe ihe siri ike mere, mmadụ ga-eje ozigbo n´ụlọgwụ. Okwukwe mmadụ m´ọbụ omenala ebe mmadụ si, ekwesịghị igbochi mmadụ ije ụlọgwụ m´ọbụ i nweta enyemaka mgbe ojighị ahụ. Nke a mere, asụ asụsụ German nwere ike inye mmadụ nsogbu ịnata ezigbo ọgwụ okwesịrị ị nata mgbe o jighị ahụ. Mmụta asụsụ German ga-enyere gị na Ezinụlọ gị aka i nweta ezigbo enyemaka mgbe mmadụ ejighị ahụ.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds