Iwu Obodo na Nkwanye Ugwu

Ihe esere ese: Esere akara ise ejiri mara `iwu´n´azụ ihe esere ese. Esere ihe eji ama ole ibu (weight) dara  n´etiti ebe ahụ, nakwa efere abụọ eji etinye ibu, ndị nke atụkwasara n´ibe abụọ, n´elu ibu (weight) ahụ.

Iwu Obodo

Austra na-ekpebi

Ọbụ iwu ndị Obodo-ndị-nọ-na-Europe-kwekọrịtara- ịbụ-otu (EU) nakwa iwu nke ndị Austria n´onwe ha tinyere bụ ihe nwere ire n´obodo Austria. Dịka iwu obodo Austria siri kwadoo, ọbụ naanị oge ụfọdụ ka enwere ike iji iwu obodo ọzọ kpebie ikpe esemokwu nke gbasara ihe mere n´obodo ọzọ.  ọ bụ nanị ndị ụlọrụikpe dị n´obodo Austria ka-enyere ike ikpebi ikpe niile gbasara ịgba Alụkwaghịm nakwa ikpebi ikpe  gbasara nlekọta ụmụaka.

Mmad niile ha otu

Ihe mbụ a na-ebu n´obi mgbe ndị ụlọikpe na ndị ụlọrụ ndị obodo na-enwe Mkpebi ikpe ọ bụla bụ na mmadụ niile ha otu n´ihu iwu obodo. Ndị nwoke na ndị nwanyị ha otu. Adịghị anabata udị ịkpaoke ọ bụla m´otu, ịkpaoke dịka mmadụ ịbụ nwoke m´ọbụ ịbụ nwanyị, udị ụka mmadụ na-eje m´ọbụ udị ọcha anụ ahụ mmadụ na-acha. Dịka iwu obodo siri kwadoo, ọ bụ naanị ndị Amaala (Austrian citizen) ka-enwere ike inye  ọnọdụ ka mma karịa ndị ọzọ.

Iwu obodo b maka onye bla  

Iwu obodo Austria ji onye ọ bụla bi n´ime ya. Omenaala ndị mmadụ si obodo ọzọ bịa, nke iwu obodo Austria anabataghị, agaghị egbochi ịta mmadụ ahụhụ mgbe ọ dara iwu. A ga-ata mmadụ ahụhụ mgbe ejiri nkwanye (ike = force) lụnye ya nwanyị obi ya nabatara, na-agbanyeghị ma omere nke n´ime obodo Austrịa ma omere ya na mba ọzọ.

Ike Mmadụ nwere nakwa Mmad inwere onwe ya ọzọ

Austria kwere nkwa ị kwanyere mmadụ iwu dịịrị ya. Iwu nkwanye Ugwu nyere onye ọ bụla nnukwu Ike (Right), o nyekwara aka gbochie ihe ọ bụla nwere ike imegide Ohere (Freedom) mmadụ nwere ime ihe dị icheiche dị mma ọ chọrọ ime. Iwu Obodo Austria, ya na Ndịọrụ obodo na ndị Ụlọikpe na-emejupụta ya, na-akpachapụ anya ịhụ na ha adaghị iwu ji nsọpụrụ ugwu dịịrị mmadụ. Mmadụ nwere ike ije ozigbo je kpesara ndị ụlọrụ na-ahụ maka ọdịmma obodo, m´ọbụ ndị ụlọrụikpe nọọrọ onwe ha (independent court), mgbe adara iwu eji asọpụrụ ugwu dịịrị mmadụ.

Kws Nkebọs

Iwu nkwanye ugwu bụ ihe dịịrị mmadụ niile bi  n´Austrịa. Na-agbanyeghị nke a, e nwere Ike (Right) ndị ọzọ ndị Amaala nwoke na nwanyị ndị Austria nwere. Iwu ndị dịka iwu ịtụ votu oge a na-azọ ọchịchị nke isi obodo na nke mba ndị dị n´ime ya, bụ naanị ndị Amaala Austrịa nwoke na nwanyị nwere ike ime nke a. E wepụ nke a, o nweghị onye ọ bụla ọzọ nwere Ike ọ bụla karịa ibe ya maka n´ọbụ nwoke m´ọbụ maka n´ọbụ nwanyị, maka udi ụka ọ na-eje m´ọbụ maka onye nnukwu mmadụ ọ bụ, m´ọbụ maka obodo kacha mma osiri pụta.

Nchekwa Aknba

Akụ na ụba ọ bụla mmadụ siri ụzọ ziri ezi kpata dị nchekwaba n´obodo Austria. Ọ bụ naanị oge ụfọdụ ihe mere ka-enyere ike ije i metụ Akụnụụba mmadụ aka.

Nkwanye Ugwu

Mmad inwe ike ikwu ihe masr ya

Otu ihe ịma atụ pụrụ iche, mmadụ na-ahụ ụbọchị niile, iji kwadoo otu obodo Austrịa si akwanyere mmadụ ugwu dịịrị ya  bụ Ike na Ohere e nyere mmadụ, iche, mee m´ọbụ ikwupụta ihe dị ya n´obi, nakwa mmadụ inwe ohere ikwe n´ihe ọ bụla ọ chọrọ ikwe na ya. Onye ọ bụla nwere ike iche ihe ọ chọrọ iche, o nwekwara ike ị banye ụka (inwe okwukwe) ọ bụla ọ chọrọ, o nwekwara ike isi n´otu ahụ pụta mgbe ọ bụla ọ chọrọ ị pụta banye n´otu ọzọ. Ihe iji maa atụ ọzọ bụ na ndị mmadụ nwere ike inwe ọgbakọ ma ha chọọ m´ọbụ imepe (ibido) otu ọ bụla ha chọrọ i mepe. Ndị ọ bụla nwere ike ikwupụta ihe dị ha n´obi. A naghị enyocha ndị Mgbasaokwu (Media) enyocha.

Ebe Ohere e nyere mmad jedebere

Ndị Ọkaiwu nwere ebe ha rụtụrụ aka Ohere ahụ enyere mmadụ ga-ejedebe. Iwu ji onye ọ bụla na-atụ atumatu ịkpọkọta ndị mmadụ ndị ọzọ ọnụ iji megide ibe ha, m´ọbụ ime Omume nwere ike ịgbawa ndị ọzọ obi (ihe dị ka `national socialism´ m´ọbụ ịsọ mmadụ asọ maka ọcha anụ ahụ ya).  Ọ bụrụ na ndị Ụlọikpe amaa mmadụ ikpe, ndị nwe obodo ga-anapụ ya Ike na Ohere niile o nwere ozigbo ozigbo site n´ịtukpu ya n´ụlọnga.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.