Mmekọ Mmadụ n´ibe ya, Ụlọ Obibi nakwa ihe gbasara Mgbe Mmadụ nwere ohere

Ihe esere ese: Esere mmadụ abụọ kwụ ọtọ n´elu ahịhịa nọ n´ezi na-elekọtara onwe ha anya. Esere ụlọ dị icheiche nọ n´azụ ha. Edere ihe ha na-agba onwe ha. Otu sịrị nke ọzọ: Hallo! Nke ọzọ sịkwara ya: Hallo!

Mmekọ Mmadụ n´ibe ya

Ibu ụzọ chee ihe gbasara onye ọzọ

Ndị mmadụ bi n´obodo Austria na-aghọta onwe ha nke oma site n´udi obi umeala na ịkwanye ugwu ha nwere n´ebe  mmadụ ibe ha ndị ọzọ nọ. Mgbe esemokwu dapụtara, ha na-ejisike ịhụ na ha ji aka ha kpezie. Onye ọ bụla anya ruru ala  ga-ahụ etu ndị obodo Austria si ebi ndụ ha na etu ha na-esi akwanyere mmadụ ugwu. Mmekọrịta na nkwukọrịta ha na mmadụ ndị ọzọ a naghị enye nsogbu ibido.

Ịdị nkwadobe inye aka bch bla

Mmadụ i nyere ibe ya aka dị ebe niile n´obodo Austria, ọ kacha mkpa i nyere agbata obi mmadụ aka, (dịka inyere ya aka imezi ihe). Ha na-ewepụta onwe ha kwupụtara onye a na-emegbu emegbu ọnụ ya. Iwu kwuru na onye ọ bụla nọ nso ga-enyerịrị aka mgbe ihe mgberede ọ bụla mere.

Inye aka mepụta ihe na-anaghị ego

Ọtụtụ ndị mmadụ bi n´obodo Austria nwere ọrụ akwụghị ụgwọ ndị ọzọ ha na-arụ. Nke a pụtara na ha nọ n´otu dị icheiche ebe ha na-eje enye aka mgbe ha nwere ohere na-anaghị ego ọ bụla. Onye ọ bụla nwere ike iso n´otu ndị dị otu a. E nwere otu dị icheiche dịka: otu ndị n´azọpụta mmadụ mgbe e nwere ihe mgberede, e nwere otu ndị na-agbanyụ ọkụ na-ere ere, e nwere otu ndị na-elekọta ndị n´ejighị ahụ, e nwere otu ndị na-ahụ maka ezì (ilo = environment), e nwere otu ndị na-ahụ maka egwuregwu, nakwa otu ndị ọzọ dị icheiche ebe mmadụ na-eje enweta onwe ya mgbe onwere ohere. Mmadụ na ibe ya na-amata onwe ha site na-ịnọ n´otu ndị dị etu a.

lobibi

Gee nt  n´iwu

Iji wee bie n´udo na ańụrị, ndị mmadụ bikọsịrị ọnụ n´ụlọ, m´ọbụ ndị bi na nnukwu ebe obibi, ga-emejupụta iwu ndị nwe ụlọ ahụ tinyere. Ndobe iwu nke a na-egbochi esemokwu. Ọ bụ ebe edepụtara ihe niile gbasara ụlọ ahụ ka-edekwara iwu eji ebi n´ụlọ. A na-akụdo iwu ahụ n´akụkụ ahụ aja nọ n´ala ụlọ. Jụọ ndị nwe ụlọ, m´ọbụ ndị na-elekọta ụlọ, m´ọbụ ndị ọrụ na-edobe ụlọ ahụ ọcha, m´ọbụ onye agbatobi gi maka iwu nke a, m´ọbụrụ na-ịhụghị ebe ọnọ.

Mgbe mmadụ nwere ohere

Austria, obodo nwere otu d icheiche nọ n´ime ya

Eji egwuregwu n´ihe ndị ọzọ mmadụ na-eme mgbe onwere ohere kpọrọ nnukwu ihe n´Austria ime ihe mgbe mmadụ nwere ohere kpọrọ nnukwu ihe n´obodo Austria. E nwere otu nzukọ dị icheiche ndị nwere okwukwe dịkwa icheiche, ebe mmadụ nwere ike ịje, ebe ya na ndị mmadụ ndị ọzọ ya na ha nwere otu okwukwe ga-ahụkọrịta ma mekọrịta.

mata Mmad

Mmadụ ga-eme ka ndị Amaala Austria nabata ya mgwa mgwa mgbe ọ banyere n´otu dị icheiche ha nwere, soro ha na-eme ihe dị icheiche ha na-eme, mgbe mmadụ nwere ohere. Ezinụlọ ọ bụla nwere ohere i banye otu dịka: otu egwuregwu, otu na-atụ Chess, otu ndị na-akwa (adụ) akwa, otu egwuregwu ụmụaka, otu `boys-scout´, otu ụmụaka na-agba egwu mkpịsị ụkwụ (Ballet), otu ndị na-agụ egwu nakwa otu ndị na-eme ihe na-akpa ọchị (theater concert).

Austria, obodo ekenyere ala ma (nature) na obodo nwere ezigbo omenala

Ala ọma Austria nwere mere ka e nwee ihe egwuregwu mgbagharị dị icheiche ndị a na-eyị Akpụkpọụkwụ dị ogologo na nke dị okirikiri na-agbagharị. N´oge oyi, e nwekwara ihe egwuregwu a na-anya anya dị icheiche e nwere. Ha nwekwara ebe a na-egwu mmiri n´ezi (n´ilo), ha nwere ime ọhịa ebe a na-eje mkpagharị, e nwekwara ebe emere a na-anya igwe (bicycle) n´oge anwụ na-acha. Ama Austria ama dịka obodo ọtụtụ ndị Amaala ha maara etu esi eji aka ese ihe, nakwa etu esi eji aka akpụpụta ihe. Ha nwere ezigbo omenala dịka: n´ihe gbasara ịgụ na ịkụ egwu, ime ihe na-akpa amụ, ise ihe eji aka ese, ise etu esi arụ ụlọ, ide akwụkwọ ifo (literature). Ha nwekwara ọtụtụ ebe a na-edebe ihe mere mgbe ochie (museum) nakwa egwu `Opera´, egwu ụwa niile jiri mara Austria. Ọ bụ ihe niile ndị a ka-eji mara obodo Austria amara.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.