Nchekwa ihe ekereke (elu, ala, mmiri, ikuku) nakwa nchekwa ụmụ Anụmanụ

Ihe esere ese: Esere osisi atọ kwụrụ onwe ha n´ime ọhịa. Esekwara nnụnụ ise na-efe n´elu.

Nchekwa elu, ala, nakwa mmiri (environment)

Nchekwa ihe ekereke gbara mmadụ gburugburu (elu, ala, mmiri, ikuku) dị nnukwu mkpa n´obodo Austria. Ọ dị mkpa ichekwa na idọzi ihe ndị a maka ha dị mkpa na ndụ mmadụ. Onye ọ bụla na-enye aka idozi ihe ndị a mgbe: ọ na-atufu dọtị (ahịhịa) ebe kwesịrị ekwesị, nakwa mgbe ọ na-anya ụgbọala etu kwesịrị ekwesị, na mgbe ọ na-azụrụ ihe ndị  nke emepụtara n´ime obodo nakwa mgbe ọ na-eji uche ya mara etu esi agbanye ọkụ na mmiri dị n´ụlọ ya.

tufu Dt (Ahịhịa) n´ebe kwesr ekwes

E nwere ọtụtụ ihe ndị adịghị mma ịtufu n´ebe a na-atufu ahịhịa. Ihe ndị dịka igwe, akwụkwọ, ihe nkụwa m´ọbụ ihe eji rọba rụpụta, nwere ebe ọzọ a na-atụnye ha. Ọ bụrụ na-enweghị ebe a na-atụfu ihe nke dị gị nso, ị ga-ahụ ọzọ n´okporo ụzọ nke nọ n´akụkụ ụlọ gị, m´ọbụ ị gaa tufuo ya na nke ndị ụlọrụ na-ekpofu ahịhịa nọ gị n´akụkụ. A naghị edobe ngwongwo ndị ọzọ n´akụkụ ebe a na-ekpofu ahịhịa.

Mgbochi imeso mAnman omume jọọ

E wepụ nchekwa ihe ekereke gbara mmadụ gburugburu (elu, ala, ikuku na mmiri), obodo Austria na-echekwakwa ụmụ Anụmanụ. Ọtụtụ iwu kọwapụtara etu a ga-esi edebe ụmụ Anụmanụ nakwa ihe a ga-emere ha mgbe ha ejighị ahụ na mgbe ha merụrụ ahụ. E nwere iwu siri ezigbo ike banyere mmegide ụmụ Anụmanụ.

gbọ njem

Ịnya ụgbọala otu okwesịrị na-enye aka igbochi mmebi ikuku mmadụ na-ekuru, ọ na-egbochikwa mmefu ego na-ịzụ  mmanụ ụgbọala. A ga-akwụsị iji ụgbọala na-eje ebe dị nso (ebe ndị enwere ike iji ụkwụ nkịtị eje). Obodo Austria nwere ụgbọ dị icheiche ha wepụtaara ndị mmadụ ha na-eji eje njem karịa iji ụgbọala nke aka ha. E nwere ụgbọoloko (trains) dị icheiche ndị nnukwu na ndị nta, ha nwekwara ụgbọala Bọs, nakwa ụgbọoloko nke na-agba n´ime ala (n´isi obodo Vienna). Onye na-eme otua na-egbochi mmebi ikuku mmadụ na-ekuru.

Mgbochi nnukwu mmefu k Eletrik

Ihe ntakịrị olemole na-enye na-egbochi nnukwu mmefu ọkụ eletrik: mmadụ ịgbanyụ ọkụ mgbe ọ bụla osi n´ime ụlọ na-apụ, nakwa ịkwụpụ ihe akwụnyere n´ọkụ mgbe mmadụ adịghị eji ha eme ihe, nakwa ị gbanata igwe ekpomọkụ dị n´ụlọ.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.