Nke bụ Eziokwu nakwa ebe mgbado ụkwụ

Ihe esere ese: Esere ebe a na-edebe akwụkwọ. Edebere akwụkwọ ọgụgụ iri na ise n´acha ọcha dị icheiche, n´elu ya.

Nke b Eziokwu

Gbasara Obodo

Obodo Austria bụ otu isi obodo nọkọrọ ọnụ (Federal) nke nwere mba obodo (State) itoolu (itenaanị/Iteghete) dị n´ime ya:

 

  1. Wien – Vienna (nke bụkwa isi obodo kacha elu)
  2. Burgendland (nke isi obodo ya bụ: Eisenstadt)
  3. Kärnten (nke isi obodo ya bụ: Klagenfurt)
  4. Niederọsterreich (nke isi obodo ya bụ: St. Pọlten)
  5. Oberọsterreich (nke isi obodo ya bụ: Linz)
  6. Salzburg (nke isi obodo ya bụ: Salzburg)
  7. Steiermark (nke isi obodo ya bụ: Graz)
  8. Tirol (nke isi obodo ya bụ: Innsbruck)
  9. Vorarlberg (nke isi obodo ya bụ: Bregenz)

 

Ohere (Ibu)

Austria nwere ohere dị (buru ibu ruru) 83.854 km2, ọ nọkwa n´etiti Europe.

Nd Amaala

Nderi mmadụ 8,43 bi n´obodo Austria. Ihe dịka otu n´ime mmadụ ise ndị amaala Austria bi n´isi obodo Vienna. Ihe karịrị 18% ndị mmadụ bi n´obodo Austria nwere ebe ọzọ ha siri kwabata.

Ass

Asụsụ Obodo bụ German. Anabatakwara asụsụ obodo ụfọdụ ndị mmadụ ndị ọzọ bi n´akụkụ obodo Austria dị iche iche, ndị iwu obodo nabatara agbụrụ ha.

Okwukwe

Ihe dịka 66% ndị Austria bụ ndị Roman-Katọlịk, ihe dịka 6% bụ ndị Moslem, ihe nwere ike iru 4% bụ ndị Evanjelist. Ihe dịka 10% ndị Austria bụ ndị n´enweghị okwukwe ọ bụla. Ụmụaka nwere ike iji aka ha họrọ Okwukwe ọ bụla ha chọrọ mgbe ha ruru afọ 14.

Mba ndz

Obodo Austria nwere ọnọdụ siri ike n´etiti mba ndị ọzọ dị iche iche. Kemgbe 1955 ka Austria bụ òtù (member) ndị Obodo-Ndị- Kwekọrịtara- ịbụ-otu (UNO). Kemgbe 1956 ka Austria bụ òtù (member) ndị Nzụkọ-Ndị-Europe, nke iwu ha,  nke na-ahụ maka ịsọpụrụ ugwu dịịrị mmadụ, nwekwara irè (ike) n´obodo Austria.  Kemgbe 1995 ka Austria bụ òtù (member) ndị Obodo-Ndị-Nọ-Na-Europe-Kwekọrịtara- ịbụ-Otu (EU).

 

Ihe nd mb kacha mkpa

Mmadụ na ibe ya ịha otu nakwa mmadụ inwe ọnụ onwe ya

Austria bụ obodo n´ebi ndụ ọgba ọhụrụ, obodo nke nọ n´etiti Europe ebe onye ọ bụla nwe onwe ya harakwa etu. Ike ndị na-achị achị nwere na iwu dị n´obodo si n´aka ndị amaala. Ọ bụghị iwu ndị ụka tinyere ka ndị nwe obodo ji arụ ọrụ. Ha na-eji iwu obodo na-arụ ọrụ. ọ bụkwa ndị Amaala họpụtaara onwe ha ndị na-ekwupụtere ha ọnụ ha.

Idobe Iwu

Ndị niile bi n´ime obodo nakwa obodo n´onwe ya (ndịọrụ obodo) ga-edeberịrị iwụ niile dị n´obodo. Iji mejupụta nke a, ịda iwu dịka inye mmadụ Egoazú (iri ngarị) ka a na-eji nnukwu ntamahụhụ akwụghachi ụgwọ.

Ihe eji ama na onyeọbịa emezuola ihe obodo chọrọ ya n´aka

Ige ntị na imejupụta ihe mbụ niile ndị edepụtara ebe a, dị ezigbo mkpa m´ọbụrụ na mmadụ chọrọ ka ya na ndị Amaala (ọhaneze) ndị Austria bụrụ etu. Mgba ekpebiri na mmadụ emejupụtala ihe ndị a niile, a ga-enye ya akwụkwọ (citizenship) ga-egosị na ya na ndị Amaala Austria abụrụla ma harakwa otu.

Nspr ugwu dịịr mmad

A na-asọpụrụ na-akpachapụkwara ụgwu dịịrị mmadụ anya n´obodo Austria. Nke a dị n´iwu obodo Austria, nakwa n´iwu Obodo ndị ụfọdụ dị na  Europe ndị na-ahụ maka ịsọpụrụ ugwu dịịrị mmadụ, nakwa n´iwu obodo Europe niile jịkọtara onwe ha ọnụ (EU). Ndị obodo ka-enyere iwu ịma ọrụ dịịrị ha ịhụ na-akwanyeere onye ọ bụla bi n´obodo ha ugwu dịịrị ya n´ụzọ ọbụla, nyekwa ya ezigbo otu ohere ahụ ndị mmadụ ndị ọzọ nwere. A ga-enyerịrị onye ọbụla ohere niile dịịrị ya. Ugwu na Nsọpụrụ onye ọ bụla ga-aharịrị otu, na-agbanyeghị m´ọbụ nwoke m´ọbụ nwanyị.

Nkwàdo na Nkwụdosike

Ihe e kwesịrị ịghọta mere eji nwee udo, nkwụdosi ike na otuobi ndị mmadụ bi n´obodo Austria bụ otu ha si ewepụta onwe ha, na-emere ibe ha ihe dịka ha na-emere ya onwe ha. Nke a mere eji kwesie ike n´obodo Austria rụrụ onwe ha nke oma maka ọdịmma nke ndị mmadụ bi n´ime ya. Etu ndị nwe obodo na ndị mmadụ bi n´ime ya n´esi agbata ọsọ enyemaka mgwa mgwa ma ihe mgberede ọjọọ mee, m´ọbụ mgbe mmadụ chọrọ enyemaka ego, m´ọbụ enyemaka n´ihe gbasara ahụisike ya, m´ọbụ enyemaka mgbe ihe mgberede okporụzọ mere, n´egosi udi Nnekọta na nkwado a na-ekwu okwu ya ebe a.

 

Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.