Otu Ikè (Right) ahụ
N´obodo Austria, nwanyị na nwoke nwere otu ikè (Right) ahụ, n´ihe ndị gbasara Ezinụlọ, ịgụ akwụkwọ na ịrụ ọrụ. Nwanyị na nwoke nwere otu Ugwù na otu Ikè ahụkwa. Otu ụda ka olu (voice) ha na-ada n´ụlọikpe nakwa n´oge a na-atụ votu.
A gaghị eletu ụmụnwanyị anya
Ụmụnwanyị na Ụmụnwoke Ezinụlọ ọ bụla nwere otu ike ahụ isoro mee ihe ọ bụla ndị ọzọ bi n´obodo Austria na-eme. Ha ga-ejerịrị akwụkwọ, ha nwere ike ije akwụkwọ nke karịrị akwụkwọ nke ha jere na mbido, ha ga-arụ ọrụ ma yie akwa otu ọ bụla masịrị ha. A gaghị a nabata ya m´otu ma-achọpụta na-enyeghị ha ohere niile dịịrị ha, m´ọbụ ji ike lụnye ha nwoke ha achọghị ịlu, m´ọbụ bie ha ugwu.
O nweghị onye ka ibe ya
O nweghị nwoke m´ọbụ nwanyị karịrị ibe ya. Omenala obodo mmadụ siri bịa a gaghị agbanwe iwu nke a. Mmegide nakwa iletu ụmụnwanyị anya e nweghị ohere ọ bụla n´obodo Austria.
Wepụ aka n´ime ihe Ike (garagara)
A na-ewere ya dịka ajọ arụ mgbe mmadụ ji iwe merụọ ibe ya ahụ m´ọbụ ji ihe gbasara mmerụ ahụ m´ọbụ ọnwụ na-emenye mmadụ ibe ya egwu (ụjọ). Ọ bụkwa arụ mmadụ iji okwuọnụ mee ka onye ọzọ nọrọ n´oke ụlọ echiche. A gaghị a nabata nke a. Ndị Uweojii nwere ike ịchụpụ onye ọ bụla na-eji oke iwe emebi ihe n´ụlọ ya, gwakwa ya ka ọ ghara ịlọghachite azụ ọzọ wee ruo mgbe ha kpebiri.
Ike Ụmụaka nwere
Ụmụaka nwere Ike (Right) pụrụ iche. A n´ebuzọ chee maka ọdimma ha tupu e mee ihe ọ bụla m´ọbụ nwee mkpebi ọ bụla gbasara ha. Ọ bụ iwu na-agaghị eji Iwe na Ọnụma azụlite ha. Ọ bụghị naanị ịkwa ha iko (seị) nakwa ịta ha ahụhụ ka iwu jụrụ, kama a gaghị eme ihe ọbụla ga-eme ka ha baa n´ụlọ echiche. Ụmụaka nwere Ike ị ga ịhụ Nne m´ọbụ Nna ha. A ga-egekwa ha ntị n´olu mgbe ha chọrọ ịtụ atụmatụ.
Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.