Ihe nke mbụ

Foto onyoonyoo: Esere ụkwụ nwoke abụọ, nke na-arịgo n´elu step ụlọ. Nwoke ahụ yi trauza jeans n´akpụkpọ ụkwụ nke na-acha ụlọụlọ nke eji ezigbo akpụkpọ anụọhịa mee.

Ị ga-ahụ n´ebe a, ije niile ị ga-eje, bido n´ụbọchị nke mbụ ị kpara ụkwụ n´obodo nkea. Ị ga n´ụlọọrụ ndị ọchịchị dị icheiche so n´ihe mbụ dị mkpa ị ga-eme, iji gụnye onwe gị ọsịịsọ dịka otu n´ime ndị bi n´obodo.  Ọkwa m´ọbụ ozi dị n´ime fs-easyway.at ga-enyere onye ọhụrụ ọ bụla nọ n´obodo Austria aka ị mata ihe ndị o kwesịrị ime.


Ị bịara ọhụrụ n´obodo Austria, O lee ihe ndị ekwesịrị ime?

    • Ọ bụrụ n´ịchọrọ ị nọ      karịa ọnwa isii n´obodo Austrịa, ị ga-enwerịrị akwụkwọ eji ebi n´obodo nke ga-enye gị ike ịnọ ruo ole ahụ. Biko gụọ ihe gbasara Akwụkwọ-Eji-Ebi-N´obodo (residence permit) m´ọbụrụ n´ịmaghị ihe gbasara akwụkwọ nke a.
    • Tupu mkpụrụ ụbọchị atọ agafee kemgbe ị kwabara n´ebe obibi gị, ị ga-agarịrị ka-etinye  akara (Address) ebe obibi gi n´igwe Kọmputa ndị nwe obodo.
    • Ọ bụrụ na-iji akwụkwọ eji anya ụgbọala nke obodo gị bịa, ị ga-eji akwụkwọ eji anya ụgbọ nke ndị Austrịa gbanwee nke a tupu ọnwa isii a gafee. Enwekwara ike ịsị gị lee ule ịnya ụgbọala tupu ha enye gị akwụkwọ nke ha.
    • Ọ bụrụ n´ịrụbeghị ọrụ izizi n´obodo Austrịa, a ga-achọ ka nwanyị m´ọbụ nwoke ọ bụla nyere gị ọrụ ahụ tinyere gị akwụkwọ maka inye gị akwụkwọ eji arụ ọrụ.
    • Ọ bụrụ n´ego eji akpachapụrụ ahụ gị anya karịrị ego ole ndị ụlọrụ ahụisike kewapụtara maka nke a, ha ga-achọ k´inwetara onwe gi akwụkwọ mkpuchi maka ahụisike nke onwe gị (private health insurance).
    • Ị ga-etinye akwụkwọ maka ịnabata akwụkwọ si obodo ọzọ niile ijiri jee akwụkwọ nakwa nke ijiri rụọ ọrụ nakwa digrii niile i nwere.
    • I nwere afọ abụọ i weta akwụkwọ gosiri n´inwere ike ịsụ asụsụ German.