Akwụkwọ eji anya ụgbọala

Ihe esere ese: Esere staarịn ụgbọala nakwa aka staarịn ọgbatumtum.

Igbanwe akwụkwọ eji anya ụgbọala

Ndị niile si obodo ndị ọzọ bata n´Austrịa, ga-agbanwerịrị akwụkwọ eji anya ụgbọala ha jiri bata, tupu ọnwa isii ha jiri bata nke mbu n´Austrịa agafee. Akwụkwọ eji akwọ ụgbọ ha ga-adịkwa ire (valid).

Iji mezuo nkea, a ga-ele ndị niile si obodo bata, ụle etu esi anya ụgbọala. Iwu nkea nwere ndị owezugara.

Tupu agbanwee ya, mmadụ ga-etinye akwụkwọ na nke ndị na-ahụ maka nkea.

Ndị na-ahụ maka nkea nọ n´ebe dị icheiche. Na State ndị nke isi ụlọrụ ndị uweojii dị na nke ha, bụkwa ndị isi ụlọrụ nkea, k´ọdị n´aka (ewepụ: Bregenz), ewepụkwa nkea, ọbụ ndị `local Government´ k´ọdị n´aka.

Ihe achọrọ tupu agbanwee akwụkwọ nkea

  • Ezigbo ebe obibi mmadụ ga-abụ n´Austrịa
  • Ihe gosiri na mmadụ ebiela oge ruru ọnwa isii n´obodo osiri nweta akwụkwọ eji anya ụgbọ ya. A gaghị eweta nkea m´ọbụrụ n´onye ahụ bụ nwa afọ (Amaala) obodo nyere ya akwụkwọ ahụ

Akwụkwọ ndị a ga-eweta maka mgbanwe nkea.

  • Akwụkwọ mmadụ tinyere maka mgbanwe nkea (Application Form)
  • Akwụkwọ Dọkịta dere, nke gosiri na mmadụ ji ahụ (Doctor´s Report)
  • Akwụkwọ ejiri gbanwee asụsụ dị n´ime akwụkwọ eji anya ụgbọala (ọ bụghị State ọ bụla chọrọ      nkea)
  • Akwụkwọ njem Paspọt
  • Akwụkwọ eji anya ụgbọala (Driver´s License)
  • Akwụkwọ ejiri mara ebe obibi mmadụ (House Registration)
  • Foto obere mmadụ (Passport Photos)
  • Ihe ndị eji ele ule

 

Quelle: BM.I/Polizei