Akwụkwọ Ọnọdụ

aufenthaltsbewilligung-01-01N´eziokwu

Ọbụ obodo mmadụ si ga-eme k´amara ihe iwu kwuru maka inweta akwụkwọ eji anọ n´obodo Austrịa. Ndị si obodo ndị nọ n`ime Europe (Europäischen Wirtschafsraum (EWR)) nakwa Switzerland, nwere ike ịnọ n´obodo Austrịa ruo ọnwa atọ, mana ha ga-eweta naani akwụkwọ gosiri ebe obibi ha. Ha ga-eme nke a tupu onwa anọ ha jiri bata agafee. Enwere iwu ọzọ maka ndị si obodo ndị ọzọ bịa: ọbụrụ na ha nọrọ karịa ọnwa isii, a ga-achọ ka ha gosi akwụkwọ nyere ha ikike, nke ndị ụlọrụ ọchịchị na-enye, nke a na-akpọ `residence permit´, m´ọbụrụ na ha ejighị udi akwụkwọ nke a si obodo ha pụta, dịka iwu `European Union´ siri kwado. Ị ga-ahụ iwu gbasara nke a na Fremdenpolizeigesetz – iwu ndị uweojii na-ahụ maka ndị bịara abịa (maka ọnụnọ nke agafeghị ọnwa isii) nakwa na Niederlassungs- und Aufenthaltsgesetz (maka ọnụnọ nke gafere ọnwa isii). Ọ bụ n´ụlọrụ ndị Austrịa nọ n´obodo ọzọ ka a na-etinye akwụkwọ maka inye mmadụ akwụkwọ ikike nke eji ebi n´obodo Austrịa. Naanị oge ụfọdụ ka-enwere ike ịnaba ka mmadụ tinye udi akwụkwọ nke a, n´obodo Austrịa. Ọ bụ na nke ndị ụlọrụ `local Government´ dị na State dị icheiche (Vienna: magistratsabteilung 35) ka enwere ike itinye udi akwụkwọ nke a. Akwụkwọ ikike (residence permit) na-enwerịrị ihe mere eji nye ya, nke pụtara na naanị  ụfọdụ ndị mmadụ ka a na-enye ya (dịka Di m´ọbụ Nwunye mmadụ), m´ọbụkwa ndị ọkachamara dị icheiche (dịka Ụmụakwụkwọ m´ọbụ ndị nchọpụta (Scientists)) m´ọbụkwa ihe ndị ụfọdụ ndị ọzọ (dịka ime obi ebere).

Udi Akwụkwọ Ikike (Residence Permit) dị icheiche

Enwere udi akwụkwọ ikike dị icheiche eji anọ n´obodo, mana ọbụ oge ole mmadụ ga-anọ mere ha ji dị icheiche.

Akwụkwọ ikike eji ebi n´obodo (Residence Permit)

Nke a bụ maka ndị si obodo ọzọ bịa, ndị na-achọghị ịnọ nnukwu oge. Anaghị atụ anya n´udi ndịa bịara iji obodo mere ebe obibi ha.

Akwụkwọ ikike eji ebi n´obodo (Temporary Residence Permit) maka oge ole ekwekọrịtara

Nke a bụ maka ndị mmadụ si obodo ọzọ, ndị nke enyere oge olemole ha nwere ike ịnọ n´obodo Austrịa. Oge a na-enye na-abụkarị otu afọ ruo afọ atọ.

Akwụkwọ ikike eji ebi n´obodo ruo oge ebighị ebi (Permanent Residence Permit)

Nke a bụ maka ndị si obodo ọzọ bịa, ndị enyere ohere iji obodo Austrịa mere ebe obibi ha. Akwụkwọ kaadị nkea na-abụ naanị maka afọ ise, mana mgbe ọ bụla ọgwụchara, ndị ụlọrụ ọchịchị ga-ewetịkwa ya afọ ise ọzọ.

Ihe ndị achọrọ tupu enye mmadụ akwụkwọ ikike eji ebi n´obodo

  • Onye na-etinye akwụkwọ maka inye ya udi akwụkwọ ikike nkea ga-enwe ọrụ gọsiri n´onwere ike ilekọtanwu onwe ya.
  • Onye na-etinye akwụkwọ maka inye ya udi akwụkwọ ikike nkea ga-enwe akwụkwọ kpuchiri ahụisike ya (health insurance).
  • Onye na-etinye akwụkwọ maka inye ya udi akwụkwọ ikike nkea ga-enwe akwụkwọ gosiri n´onwere ezigbo ụlọ ebe obibi.
  • Onye na-etinye akwụkwọ maka inye ya udi akwụkwọ ikike nkea ga-ahụ na-ọdaghị iwu obodo.

Quelle: BM.I

Links