Ndị Uweojii

Ihe esere ese: N´aka ekpe, esere okpu onye uweojii nke na-acha anụnụ-anụnụ, nke ejikwa eriri na-acha uhie-uhie gaa ya

Ụlọrụ ha

Enwere ihe ruru 1000 ụlọrụ ndị uweojii n´obodo Austrịa. Vienna nakwa isi obodo State niile nwere ụlọrụ Directorate ndị uweojii nke ha.

N´ebea ka ị ga-ahụ ebe edepụtara ụlọrụ ndị ụweọjii niile, nke dị na Burgenland, nakwa KärntenNiederọsterreich, Oberọsterreich, Salzburg, Steiermark, Tirol, Vorarlberg nakwa Wien.

Oge Mmepe (Office Hours)

Ụlọrụ ndị uweojii nke a na-akpọ Polizeiinspektionen, na-emepe oge ọ bụla, mana ndị nke ọzọ, ndị nke na-ahụ maka udi ọrụ ndị nke ọzọ dị icheiche, na-emepe naanị obere oge maka ịhụ mkpa ndị mmadụ bịara na nke ha (n´oge mmepe ha). Oge nkea n´oge ndị ọzọkwa abụghị otu, oge ndịọrụ uweojii nọ n´ọrụ (oge ọrụ).

Iji maa atụ: Ụlọrụ mepere bido Mọnde ruo Fraịdee, bido n´oge 07:30 ruo 15:30, mana naanị oge ha ji anabata ndị mmadụ bụ ụbọchị Tuzdee na Tọzdee bido n´oge 13: 00 ruo 15:00.

Ndị Uweojii na-ahụ maka ndị ọbịa

Ndị Uweojii nkea na-ahụ naanị maka ndị abụghị ndị Amaala (ndị bịara abịa), ndị nke ekwesịghị ibi n´obodo karịa ọnwa isii. Edere iwu gbasara nkea na´iwu `Fremdenpolizeigesetz´.

Ndị na-ahụ maka ndị ọbịa, ndị nke chọrọ ịnọ ọtụtụ oge, bụ ndị `Bezirkshauptmannschaften´ m´ọbụ ndị `Magistrate´. Iwu nkea gbadoro ụkwụ n´iwu nke `Niederlassungs-nakwa Aufenthaltsgesetz´.

 

Quelle: BM.I/Polizei

 

 Links