Ndebanye akara Adres ebe obibi

Ihe esere ese: Esere otu-otu, ime ụlọ ebe a na-arahụ ụra, nakwa nke ebe a na-ezuike, nakwa nke ebe a na-asa ahụ, nakwa nke ebe a na-esi nri. Esekwara ihe ndị dị ha n´ime.

Iwu bụ n´onye ọ bụla bi n´Austrịa ga-edebarịrị aha na akara ebe obibi ya. Ị kwafee ebe ọzọ, ọ bụ iwu na ị ga-eje kachapụ aha na akara ebe obibi gị nke ochie, n´ime mkpụrụ ụbọchị  atọ, ma debanyekwa nke ọhụrụ ozigbo. Nde niile bi n´ụlọ ahụ ga-emekwa otu ihe ahụ, nke pụtara n´ọbụghị naanị gị ka-ọgbasara, kama ọgbasara ndị ezinụlọ gị niile, nakwa ụmụaka gị.

Ndị otu ezinụlọ gị, ndị nke bịara n´ikpe azụ, m´ọbụ ụmụọhụrụ ga-edebarịrị aha na akara nkea.

Ọ bụ ndị ụlọrụ ọchịchị dị icheiche n´Austrịa bụ ndị nkea dị n´aka, na-agbanyeghị akụkụ obodo ebe mmadụ jiri mere ebe obibi ya.

Ọ bụrụ n´isi obodo Vienna k´ijiri mere ebe obibi, ị ga-eje na nke ndị magistrat local government ha. Ọgaghị abụrịrị na nke ndị ụlọrụ ọchịchị dị n´akụkụ ebe mmadụ bi ka ọ ga-eme nkea. I nwere ike ije tinye aha na akara ụlọ ebe obibi gị na nke ndị ụlọrụ ọchịchị obodo ọ bụla ị chọrọ nke dị na Vienna.

Na State ndị nke ọzọ, ọbụ ndị ụlọrụ ọchịchị obodo dị icheiche, ndị nke dị na local government dịkwa icheiche, na-eme nkea.

A naghị akwụ ụgwọ maka idebanye aha na akara ebe obibi mmadụ. Iji gosi na-edebanyela aha na akara nkea, a ga-enye gị akwụkwọ nke anakpọ Meldebestätigung. A na-akpọ nkea `Meldezettel´ n´oge mbụ; enwere ndị na-akpọ ya aha nkea ruo taa.

Nkea bụ akwụkwọ ndị ị ga-eji nwee ike debanye aha na akara ebe obibi gị:

 

Quelle: BM.I

Links