Akwụkwọ eji arụ ọrụ

Ihe esere ese: Akwụkwọ ọcha esuru stampụ n´elu ya. Eji ihe odide n´acha ndụ-ndụ maakịa gud n´ime stampụ ahụ esuru. Esekwara Stampụ ahụ nke n´acha aja-aja.

Onye ọ bụla ruru afọ 15 nwere ike ibido ịrụ ọrụ n´Austrịa. Oge niile onye ahụ gbara na-amụ ọrụ (apprentice) sokwa niime ya. Iwu ji nwatakịrị ọ bụla bi n´Austria, ịgụ akwụkwọ wee ruo afọ 15, mgbe ọ ga-agụcha akwụkwọ nke 9.

Iji rụọ ọrụ dika iwu kwadoro n´Austria, onye ọ bụla si obodo ọzọ bịa ga-enwerịrị akwụkwọ eji arụ ọrụ. Ọ bụ udi Akwụkwọ_Eji_Ebi_N´obodo i nwere ga-ekwu ma ị ga-enweta akwụkwọ eji arụ ọrụ m´ọbụ ị gaghị enweta ya.

Akwụkwọ ndị eji ebi n´obodo nke a na-akpọ Daueraufenthalt – EG, nakwa Rot-Weiß-Rot-Karte plus nyere gị ike i mepe ahịa nke gị m´ọbụ ị rụrụ onye ọzọ ọrụ, na-ejighị akwụkwọ eji arụ ọrụ. Ị ga-anọ ọtụtụ oge n´obodo Austrịa tupu enye gị udi akwụkwọ nke a.

Udi akwụkwọ ndị ọzọ eji ebi n´obodo kwadoro na mmadụ ga-enwerịrị akwụkwọ eji arụ ọrụ tupu o nwee ike ịrụ ọrụ iwu kwadoro n´Austria.

Akwụkwọ eji arụ ọrụ dị udi abụọ: Beschäftigungsbewilligung und die Arbeitserlaubnis. Lee otu ha si dị icheiche:

 

Beschäftigungsbewilligung

(Employment permit = akwụkwọ eji arụ ọrụ nke mbụ)

Ị ga-eji udi akwụkwọ nke a m´ọbụrụ n´ịrụbeghị ọrụ nke mbụ n´obodo Austrịa, m´ọbụ i jighị otu n´ime akwụkwọ eji ebi n´obodo nke ekwuru okwu ya na mbụ.

A na-enye akwụkwọ eji arụ ọrụ nke mbụ naanị maka otu udi ọrụ na maka naanị otu ụlọrụ.

A na-enye akwụkwọ eji arụ ọrụ nke mbụ naanị maka otu afọ, ọ bụkwa onye na-akpọ mmadụ n´ọrụ na-etinye akwụkwọ ka enye mmadụ nke a.

 

Arbeitserlaubnis

(Work permit = akwụkwọ eji arụ ọrụ nke ezigbo)

Tupu i nweta akwụkwọ eji arụ ọrụ nke ezigbo ya, ị ga-arụrịrị ọrụ n´Austrịa n´ụzọ ziri ezi ruo onwa 14 tupu izu ụka 52 a gafee, ị ga-enwekwa akwụkwọ Rot-Weiß-Rot-Karte.

Nke a bịa na-mmejupụta, ezinụlọ onye ahụ (nwunye ya na ụmụaka ya) ga-enweta otu ezigbo akwụkwọ ahụkwa eji arụ ọrụ. Nke a ga-enwe isi m´ọbụrụ na ndị ezinụlọ ya a nọọla ihe ruru ọnwa iri na abụọ n´Austrịa.

A na-enye ezigbo akwụkwọ eji arụ ọrụ naanị maka otu isi obodo (State) nakwa maka afọ abụọ, ọ bụkwa onye akpọrọ n´ọrụ ga-eji aka ya tinye akwụkwọ ka-enye ya nke a. Ọ bụ ndị `Arbeitsmarktservice´ na-enye nke a. Ọ bụkwa onye akpọrọ n´ọrụ ga-etinye akwụkwọ iji gbanwee akwụkwọ ahụ mgbe oge mgbanwe ya ruru. Tupu i nweta m´ọbụ gbanwee ezigbo akwụkwọ eji arụ ọrụ, o nwere Akwụkwọ Formular pụrụ iche ị ga-eji ede ya.

 

Quelle: BM.I