Oge Ezumike

Ihe esere ese: Esere osisi nkwụ nke nọ n´akụkụ mmiri, ya na ihe eji edina ala, nakwa ọmbrela eji eche anwụ. Esere ụgbọ mmiri n´azụ ihe ahụ esere ese.

Iwu Austrịa kpebiri na ndị ọ bụla na-arụ ọrụ nwere Ike (Right) ị ga ezumike. E deputere iwu nke a na-akwụkwọ eji ewe mmadụ n´ọrụ.

Ndị ọ bụla na-arụ ọrụ nwere Ike (Right) i were izuuka ise n´ime otu afọ maka ezumike. Mmadụ rụọ ọrụ ruo afọ iri abụọ na ise, o nwere ike i were izuuka isii n´ime otu afọ maka ezumike.

N´ime afọ nke mbụ mmadụ na-arụ ọrụ, a ga-agbakọrọ ya naanị ụbọchị olemole onwere ike i were ezumike n´ime ọnwa isii. Ọ bụ bido n´ọnwa nke asaa ka-onwere ike i nweta ụbọchị ezumike niile o kwesịrị i nweta dịka iwu siri kwadoo. Na mbido afọ nke abụọ, ka o nwekwara ike i nweta ụbọchị ezumike niile o kwesịrị i nweta na mbido afọ ahụ. A ga-agbakọnye ụbọchị niile mmadụ rụrụ ọrụ n´ụbọchị niile ọ hapụrụ ọrụ ya maka ịgụ akwụkwọ, m´ọbụrụ na-ọgbanweghị ọrụ ya.

Mgbe mmadụ nọ ezumike, a ga-ewere ụbọchị niile o jighị ahụ dịka ụbọchị ọrịa, a naghị agụnye ya n´ime ụbọchị ezumike ya.  Iwu nke a nwere ire naanị mgbe mmadụ rịara orịa karịrị ụbọchị atọ.

A ga-ajụ inye mmadụ oge ezumike mgbe ọ hapụrụ ịga ezumike karịa afọ abụọ o kwesịrị i were oge ezumike ya kpọrọ ihe.

O nweghị ihe ọ bụla gbochiri ịkwụ mmadụ ụgwọ ọnwa ya mgbe ọ nọ ezumike.

 

Quelle: BMASK

Links