Oge Ọrụ

Ihe esere ese: Igwe elekere nnukwu abụọ nke eji ihe n´eji oji nakwa ihe ọcha nakwa nke n´acha anụnụ-anụnụ wee rụọ. Nke nọ n´aka ekpe na-egosi elekere asaa, ebe nke nọ n´aka nri na-egosi elekere atọ.

E nwere ụzọ oge ọrụ abụọ: ezigbo oge ọrụ nakwa oge abụghị oge ọrụ `over-time´.

N´obodo Austrịa ezigbo oge ọrụ bụ awa asatọ n´ime otu ụbọchị, m´ọbụ awa 40 n´ime otu izuụka. Mana e nwere mwezuga dị n´iwu nke a.

Oge ọ bụla  gafere oge eji arụ ọrụ a banyela na `over-time´. A na-eji ego m´ọbụ inye mmadụ oge ezumike, akwụghachi ụgwọ `over-time´.

N´ụbọchị ọ bụla, a na-enye mmadụ oge ezumike ruru nkeji 30 mgbe ọ gafere awa isii ọrụrụ ọrụ. A naghị agbakọnye oge ezumike nke a dịka oge ọrụ, anaghịkwa akwụ mmadụ ụgwọ maka ya. A ga-enwerịrị oge ezumike ruru awa iri na otu n´ime ụbọchị niile mmadụ rụrụ ọrụ.

E nwere oge ezumike ruru awa 36 na ngwụcha izu ụka ọ bụla, mana e nwere ihe mwezuga  dị n´iwu nke a.

Quelle: BMASK/BM.I

Links