Udi Ọrụ dị icheiche

Ihe esere ese: Foto onyoonyoo abụọ: Otu nwoke nọ ala n´ihu kọmputa. Onye na-ere ihe n´ụlọ ọriri na nkwari, na-eresị ya mmanya.

Ọ bụ Oge ole n´izuka mmadụ ga-arụ ọrụ ga-akọwa m´ọrụ ahụ ọbụ ọrụ ụbọchị niile (full-time job) k´ọbụ ọrụ ụbọchị olemole (part-time job).

A naghị eji Awa ole mmadụ rụrụ ọrụ na-agbakọ ụmụ ọrụ-obere-oge ndị ọzọ mmadụ na-arụ, kama a na-agbakọ ya site n´ego ole mmadụ si na ya nweta n´afọ ọ bụla. O nwekwara ego ole n´afọ iwu kwuru n´ọgaghị a gafe.

Ndị akpọrọ n´ọrụ bụ ndịọrụ nwanyị na nwoke ndị nke ndị kpọrọ ha n´ọrụ na-akwụ ụgwọ ọnwa.

Ndị na-arụrụ onwe ha bụ ndị nwere ụlọrụ nke ha m´ọbụ ndị ha na mmadụ ndị ọzọ soro nwere ya.

Ndị ọhụrụ na-arụrụ onwe ha ọrụ bụkwa ndị iwu kwadoro ka ha na-eme nke a na-ejighị akwụkwọ nyere ha ike ime nke a. Ụdi mmadụ ndị a bụ ndị nwere ike iji aka ha rụpụta ihe bara uru (dịka ndị na-eme Film).

Ndị na-amụ ọrụ bụ ndị akpọrọ naanị maka ịkuziri ha akaọrụ dị icheiche wee ruo mgbe ha mụtachara.

Ndị IT (Trainee, Industrial attachment) bụ ndị gụchara akwụkwọ na-achọ ebe ha ga-amụ ọrụaka gbasara ihe ha gụrụ n´akwụkwọ, nke a mere ha anaghị eri ụgwọ ọnwa.

 

Quelle: BMASK/BM.I