Social:Nlekọta ọdịmma mmadụ

Foto onyoonyoo: Eriri na-acha anụnụ-anụnụ nakwa nke na-acha ọcha, kekọtara onwe ha ọnụ. Azụ foto ahụ na-acha uhie-uhie.

Austrịa bụ obodo na-elekọta ndị bi n´ime ya. Ndị niile bi n´obodo Austrịa abụghị naanị na ha ga na-ebi n´obi oma n´obodo ha, kama a na-enye ha nlekọka kacha mma mgbe ha ejighị ahụ, nakwa mgbe ha nọ n´amkpa. Ndị mmadụ bi n´Austrịa nwere ike ibido ọrụ nlekọta mgbe ọ bụla ha chọrọ.

Ndịọrụ nlekọta ọdimma ndị mmadụ nwere ọrụ enyemaka dị icheiche ha na-enye n´Austrịa. Ọ bụghị naanị ilekọta ndị ọrịa n´ụlọgwụ bụ ọrụ ha, kama ha na-elekọtakwa mmadụ n´ụlọ obibi ya. N´ebe nke mbụ, a ga-enye gị ozi gbasara ndị ọrụnlekọta, dịka ndị nke na-elekọta ndị mmadụ n´ụlọ obibi ha.

N´ebe nke abụọ, a ga-eme k´ịmara ohere mmadụ nwere gbasara enyemaka a na-enye ndị ahụ ezụghị ọke nakwa ebe ha nwere ike isi na-enweta ego.

N´ebe nke atọ, a ga-enye ozi gbasara ebe nakwa etu esi enweta ihe ndị okenye chọrọ, maka ha nwere nnukwu mkpa dị icheiche karịa ndị na-eto eto.

Inweta ọnọdụ site na-ịrụ ọrụ nlekọta

Mgbe mmadụ gara biri n´obodo ọzọ, ọnaghị adị nfe ịnọkwata ngwa ngwa, bịakwa ya na ndị Amaala obodo ahụ abịakwa bụrụ otu. Mana jisie ike! Ọdịmkpa ịmata akụkọ gbasara ndị ịnọ n´obodo ha, nakwa ihe gbasara omenala ha, nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa ịmata, ọkacha mkpa: jee ebe ha nọ, mata ụfọdụ n´ime ha.

Ọbụrụ n´oge ịbịara ọhụrụ, ọ bụ naanị ndị obodo gị ka ịchọrọ mmekọ ngị na ha, jisiekwa ike, mee ngwa ngwa ka ngị na ndị Amaala Austrịa mata onwe unu.

Ewepụ ịmata mmadụ n´ụlọ, m´ọbụ n´ebe ọ na-arụ ọrụ, a na-esikwa n´otu ndị ọrụ ebere dị icheiche amata mmadụ. Mgbe ị na-eme nke a, ị na-enye aka bara uru pụrụ iche, ndị mmadụ ga-amata n´isiri ike n´ọrụ.

Otu ndị a bụ ndị dịka Fire Service, m´ọbụ otu ndị na-agbata ọsọ enyemaka ozigbo mgbe ihe mgberede mere. Edepụtere akara Internet ndị otu ụfọdụ dị otua na ngwụcha (n´ala) ebe a.

Ebe edepụtere ma kọwaa isi okwua nke ọma bụ n´akwụkwọ obere “Sinnvoll engagieren/Ehrenamtliches Engagement in ọsterreichischen Vereinen” nke ndị Austrịa Integrationsfond (otu na-ahụ maka nnabata ndị ọbịa).

Enyemaka na Nkwado

Otu ndị ọrụ ebere nakwa otu ndị ọzọ dịkwa otua, na-arụkwa ọrụ ebere dị icheiche: ndị otu ndị a na-arụ ọrụ ebere dị icheiche n´ụbọchị ọbụla, (dịka inye ndụmọdụ , ikuzi asụsụ German m´ọbụ ilọta ụmụaka) Ha anaghị ana egọ ọ bụla maka ọtụtụ ọrụ ndị a.

Na-agbanyeghị nkwado, ndị otu niile ndị a nwere ebe ha na-akpọkọta mmadụ ọnụ maka ikwukọrịta na mmekọrịta.

 

Links