Ndị Ahụnkwarụ

Ihe esere ese: Esere square atọ kwụ icheiche. N´ime nke mbụ, esere onye ahụnkwarụ nọ n´elu igwe ya. N´ime square nke abụọ, eji ihe odide ojii see okirikiri obere ato, nke nọ n´elu ihe na-acha odo-odo. Na nke atọ, esere ihe dị ka ntị mmadụ eji ihe kabichie.

Ndị isi ọchịchị obodo Austrịa kwenyere n´afọ 2012, na ha ga-esoro kwadoo mkpebi ndị `UN Disability Rights Convention´, maka ndị ahụnkwarụ. Enwere ihe 250 a ga-akwado, mana a ga-emegide ya n´usoro, n´usoro, ruo afọ 2020 mgbe ọ ga-agwụcha.

Nkea mere ndị obodo Austrịa ji na-akpachapụ anya nnukwu, iji hụ na ndị ahụnkwarụ na ndị mmadụ ndị ọzọ ha otu. Nkea gbasakwara ụlọakwụkwọ, nzulite, ülörụ, nakwa ihe ndị ọzọ na-enyere ndụ aka.

Enwere Paspọt pụrụ iche emere maka udi mmadụ ndịa, nke ha nwekwara ike iji egosị onye ha bụ. A ga-ewepụrụ onye ọ bụla ji udi Paspọt nkea ego nihe dị icheiche dịka, tiketi eji aba ụgbọ. Ebe dị icheiche nwere ebe pụrụ iche ha meere ndị ahụnkwarụ idobe ụgbọala ha. Ichụ ha n´ọrụ anaghịkwa adị nfe.

Ndị obodo Austrịa nwere ego dị icheiche ha na-enye ndị ahụnkwarụ nakwa ndị ezinụlọ ha. A na-ewepụrụ ha ego n´ihe dị icheiche, dịka n´ihe gbasara ụtụ (tax). Ndị ụlọrụ na-akwụ ụgwọ maka nlekọta ụmụaka, na-enye ha ego karịrị nke ibe ha. Gụọ ihe ndị ọzọ gbasara nkea n´ebea Service-Seiten des Bundeskanzleramtes.

Enwere ndị otu dị icheiche na-ahụ maka ndị ahụnkwarụ. Ndị `Isi Ministrị na-ahụ maka ọrụ, nlekọta ọdimma mmadụ nakwa ihe gbasara ihe oriri´ nwere ebe ha nwere n´igwe InternetInfo-Services , ebe mmadụ nwere ike ịpị aka, nwee ike gụọ, họrọkwa ụlọrụ enyemaka nke kaara ya mma.

Enwere ndị Ọkiikpe, ndị ọchịchị obodo họpụtara, ka na-ahụ maka ihe niile gbasara ọdịmma ndị ahunkwarụ.

Ihe ọzọ dị mkpa ikwu ebea, bụkwa maka mwepụ ewepụrụ ihe niile nwere ike igbochiri ha ịgafere ụzọ. Ndị niile na-arụ ihe, ga-arụnye ebe ndị ahụnkwarụ ga-esi nwee ike ịgafere n´enweghị nsogbu ọ bụla. A na-arụnye ihe ndị dị otua n´ụlọakwụkwọ ha, nakwa n´ebe ha na-arụ ọrụ, nakwa n´igwe dị icheiche mmadụ n´ibe ya na-eji enwe nkwukọrịta, nakwa n´ebe a na-egwu egwu dị icheiche.

 

Quelle: BMASK

Links