Ndị Okenye

Ihe esere ese: Esere osisi na-acha aja-aja, nke naanị ya kwụ n´etiti ọhịa. Esekwara urukpu na eligwe na-acha anụnụ-anụnụ n´azụ ya.

Afọ ole atụrụ anya mmadụ ibi n´ụwa, nke ndị obodo Austrịa, na-agbagolite mgbe ọ bụla. Tata, enwere ọtụtụ ndị okenye n´Austrịa karịa ọtụtụ afọ gara aga. Nke a bụ maka na ahụ gbara ndị okenye kne ugbua gara gara karịa ndị mgbe ochie. Ọ bụ maka nke a ka-ejiri wepụte ọrụ dị icheiche maka ndị okenye nakwa ebe dị icheiche ha ga-eje maka ezumike mgbe ha nwere ohere.

Ndị okenye bakwara uru n´ọgbọ ndị mmadụ. Ndị okenye kwesịrị isi ike, sorokwa n´ihe gbasara ọrụ nlekọta ọdịmma mmadụ, nakwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa ihe gbasara akụ na ụba nakwa omenala obodo. Isiokwu ebe a bụ etu a ga–esi kwadoo nakwa mezie ndụ ndị okenye na-ebi.

Obodo Austrịa na-elekọta ndị okenye nnukwu, ndị nke ejighị ahụ, nakwa ndị nke nwere ihe ọdachi dị icheiche.

Ọ bụ ndị gụrụ akwụkwọ nakwa ndị mụrụ ọrụ dị icheiche maka nke a, na-elekọta ndị okenye, wee ruo mgbe ha kara ezigbo nka.

A na-arụ ọrụ dị icheiche, dịka nlekọta nakwa Enyemaka ụtụtụ na abalị, n´ụlọ ebe obibi dị iche arụpụtaara ha. Ewepụ nlekọta a na-elekọta ha, enwere ebe nlegharị anya nakwa ebe egwuruegwu dị icheiche a na-akpọkwa eje.

A na-enyere ndị nke bi n´ụlọ onwe ha aka ịrụ ọrụ dị n´ụlọ, m´ọbụ nyere ha udi aka nke a na-akpọ `24-Hour-Service´ mgbe ha chọrọ.

Ọ bụ ndị obodo na ndị otu ndị ọzọ dị icheiche haziri udị enyemaka ndị a niile. Lee anya n´akara Internet ndị edere n´okpuru ala ebe a.

 

Quelle: BMASK

 

 Links