Ndị ọrụ ha bụ nlekọta ọdimma ndị mmadụ

Ihe esere ese: Esere mmadụ wepụtara aka ya abụọ, nke etinyere otu mkpụrụ ọsisi apụl n´ime ya.

Ndịọrụ nlekọta ọdimma mmadụ nwere ọrụ enyemaka dị icheiche ha na-enye n´Austrịa. Ọrụ ha dịkwa icheiche: enwere ndịọrụ ha bụ iji ụgbọala, enwere ndị nke ọrụ ha bụ ilekọta ndị mmadụ n´ụlọ ha, enwere ndị nke ọrụ ha bụ `day-care services´ nakwa ndị nke ọrụ ha bụ ilekọta ndị nọ n´ụlọgwụ.

Ndịọrụ ụgbọala bụ ndị nke a na-akpọkwa ndị `Essen auf Rädern´, ha na-eji ụgbọala na-ebugara ndị mmadụ ihe oriri dị ọkụ n´ụlọ ha, ndị na-enweghị ihe ha ga-eri.

Ndị ọrụ ha bụ ilekọta mmadụ n´ụlọ, na-eje n´ụlọ ndị chọrọ enyemaka, dịka ndị okenye,  maka ilekọta na-inyere ha aka.

Enwere ndị ọrụ nlekọta na-arụ ọrụ n´ụlọ ebe a na-edebe ndị okenye, n´ehihie ma n´abalị. Ndị nke `Day-Care Services´ bụ ndị nke na-arụkwa n´otu ebe ahụ naani n´oge ehihie.

State ọ bụla nwere ndịọrụ nlekọta nke aka ha n´obodo Austrịa. Ndịọrụ State nke a dịkwa  n´aka  bụ ndị `local Government´, nakwa ụlọrụ obere ndị ọzọ nke State. Na Vienna, mmadụ ga-eje na nke ndị `Sozialzentren´ (www.wien.gv.at→gesundheit→leistungen→wiener-sozialzentren) m´ọbụ na nke ndị Fonds Soziales Wien.

Ị ga-enweta ozi nnukwu maka ihe ndị ọzọ ndịọrụ nlekọta ọdịmma ndị mmadụ na-arụ, mgbe ị pịrị aka n´igwe Internet ha:

Bundesministeriums fụr Arbeit, Soziales und Konsumentenschutz,  (www.bmask.gv.at→site→Soziales→Pflege_und_Betreuung→Soziale_Dienste)

Ọ bụrụ n´onwere onye ezinụlọ gị ahụ adịghị chọrọ enyemaka, biko mee ka ndị ụlọrụ ndị `Bundesministeriums fụr Arbeit, Soziales und Konsumentenschutz´ (www.bmask.gv.at→site→Soziales→Pflege_und_Betreuung→Pflegegeld) mara maka ya maka ihe gbasara ego a na-akwụ onye na-elekọta mmadụ.

Ị ga-ahụkwa aha otu ndị ọzọ ọrụ ha bụ ilekọta ọdịmma ndị mmadụ, ebe edepụtere ya n´okpuru ala ebe a.

Ịma atụ ihe gbasara ilekọta onye ọrịa n´ụlọ

Ndị ọrịa abụghị naanị n´ụlọgwụ ka ha na-enweta nlekọta nakwa Enyemaka, kama ma n´ụlọ ebe obibi ha. Ọ bụ ndị gụrụ akwụkwọ nakwa ndị mụrụ ọrụ dị icheiche maka nke a, na-elekọta ndịọrịa.Ndị na-elekọta ndịọrịa n´ụlọ, na-akpachapụ anya ịhụ n´onweghị ihe gbanwere etu ha sị ebi ndụ n´ụlọ ha.
Ọrụ dị icheiche ndị na-elekọta ahụ n´ụlọ na-arụ, dị akwụkwọ nakwa n´igwe Internet ndị ụlọrụ ndị a.
N´okpuru ebe a ka-edepụtara akara Internet ndị ụlọrụ, nakwa ndị otu, ndị na-elekọta ndịọrịa n´ụlọ ha.

 

Quelle: BMASK

Links