Obodo nọọrọ onwe ya
Obodo Austria ekpebiela na ha ga-anọrọ onwe ha. Nke a pụtara n´obodo Austria agaghị eje ọgụ m´ọbụ inyere obodo ọzọ aka ịlụ ọgụ. Austria kpebiri na ha ga-azọ isi onwe ha mgbe ọ bụla mba ọzọ lụsoro ha ọgụ. Ndị ọkwamgbọ (Ndịagha) sị obodo Austria na-eso eje obodo ọzọ ebe a na-ekpe udo, ha na-esokwa na-enyere obodo ọzọ aka ebe nsogbu dapụtara, ha na-enyekwa aka n´ime obodo ha mgbe enwere ihe mgberede.
Iwu iso ndịọkwamgbọ (Ndịagha) na iwu Ife Alanna
Nwa Amaala nwoke ọ bụla ga-ejerịrị soro ibe ya mụọ etu esi akwamgbọ m´ọbụ udi ọrụ ife Alanna ndị ọzọ dị icheiche. Ụmụnwanyị nwekwara ike ị banye otu ndị ọkwamgbọ (Ndịagha) ma ha chọọ.
Ezigbo Ntamahụhụ ga-adịrịrị
Ọ bụrụ n´onye a bụghị nwa Amaala obodo Austria daa iwu obodo, m´ọbụ mee ihe obodo sị emela, m´ọbụ nweta ọrụ nzuzo, na-arụkwa ya na-enweghị akwụkwọ eji arụ ọrụ, m´ọbụ lụọ nwanyị (nwunye) n´ụzọ n´ezighị ezi maka inweta akwụkwọ eji ebi n´obodo, ndịọrụ nwe obodo ga-akwụsị ileba anya na-akwụkwọ o tinyere maka i nye ya akwụkwọ eji ebi n´obodo, ha nwekwara ike ịchụpụ ya n´obodo ha nyekwa ya iwu ka ọ ghara ị bata ọzọ. Nke a bụ na-agbanyeghị ntamahụhụ nke ndị ụlọikpe ga-ata ya.
Nchekwa site n´aka ndị Uweojii
Austria bụ otu n´ime obodo nọ n´uwa ebe ezigbo udo na-achị. Ndị Uweojii ndị nwoke na ndị nwanyị ndị nke ọrụ ha bụ i chekwa ime obodo Austria dị ihe dịka mmadụ 30.000. Ha na-alụso ndị na-emebi iwu obodo na ndị otu ndị omekome ọgụ. Ha na ndị obodo ọzọ dị icheiche na-arụkọ ọrụ nke mere ha nwere ike ị gafere n´obodo ha, jee obodo ọzọ je rụọ ọrụ ha etu okwesịrị. Obi ruru ndị mmadụ bi n´obodo Austria ala n´ihe ọ bụla ha na-eme, maka ha nwere ezigbo ntụkwasị obi n´ebe ndị Uweojii ha nọ.
Quelle: Ọsterreichischer Integrationsfonds.