FS Easy Way

FS EASY WAY  bụ ebe igwe Internet, nke emere maka ndị ọhụrụ si obodo ọzọ bata n´obodo Austrịa, ndị nke n´abụghị ndị Amaala Austrịa, m´ọbụ ndị Amaala Switzerland.

Ndị si n´aka ndị `European Integrationsfond (EIF)´ wee mepee `FS Easy Way´ bụ ndị otu Fair und Sensibel Ọsterreich, mana ndị nkwado ha bụ ndị `Bundesministerium fụr Arbeit, Soziales und Konsumentenschutz´ nakwa ndị `Bundesministerium fụr Inneres´. Otu ndị European-Turkish Democrats nakwa ndị Ghana Minstrel Choir sokwa na-enye aka.


EIF Project 2012 nke ndị European Integrationsfond

Ezigbo aha Project nkea bụ: P.O.P. 2013: Ebe emere maka igosi mmadụ ezigbo ụzọ mgbanwe – ịdịnotu karịa nkewasị, nkwukọrịta nakwa mmekọrịta mmadụ n´ibe ya, iji gbasaa ozi ihe gbasara ugwu na ndụ. 

Ndị eji maka ha mepụta Project nkea bụ ndị niile siri obodo ọzọ bịa, ndị nke mejupụtachara ihe niile iwu kwuru maka inweta ezigbo ọnọdụ nakwa ezigbo akwụkwọ eji ebi n´obodo Austrịa, mana ha abụghị ndị Amaala Europe m´ọbụ Switzerland. N´aka nke ọzọ, ndị Amaala obodo Austrịa jiri obi ha nabata ma kwadookwa Project nkea.

Ihe ndị sokwa na Project nkea bụ, imepe nakwa ịrụnye nnukwu ebe kọmputa, ebe ndị mmadụ si obodo ọzọ bịa, nwere ike isi nweta ezigbo ozi ntuzi ụzọ dị icheiche. A na-atụ anya na ndị nwe ebe Kọputa nkea ga-agbasa ozi nye ndị niile bịara ọhụrụ n´obodo ha. A na-ele anya na ha ga-ahazikwa nzukọ ugboro ugboro ebe ndị ọhụrụ niile si obodo ọzọ bịa nakwa ndị Amaala obodo Austrịa ga-enwe nkwukọrịta okwu gbasara omenala ha.

Ndị na-ahụ maka Projekt nke a bụ ndị European Integrationsfond, ndị Ministry na-ahụ maka ime obodo (Austrịa) nakwa ndị  Ministry na-ahụ maka Ọrụ, Enyemaka (nlekọta ndị chọrọ enyemaka) nakwa Ihe oriri.

Otu `Fair und Sensibel Österreich´

Akwụkwọ asambodo. Esere n´lu ya: Rose flawa nke nọ n´elu ihe na-acha ndụ ndụ. N´okpuru ya, ebe n´eji oji ka-eji ihe ndị odide na-acha odo odo, oroma na ọcha, wee jikwa ihe na-acha ọcha dị icheiche dee: Fair und Sensibel Ọsterreich. N´akụkụ ya ka-esere Austrian Flag.

Ọ bụ Dr. Erik Buịbaum, Director-General onye oge mgbe ahụ, nke na-ahụ maka nchekwa ohaneze, nakwa Dr. Peter Stiedl, onye isi ndịUweoji oge mgbe ahụ, bidoro Project nke mbụ a na-akpọ `Polizei und Afrikaner´ n´afọ 2000. Ọ bụkwa n´afọ 2004 ka-akpọrọ ya aha ọzọ,  `Fair und Sensibel – Polizei und AfrikanerInnen´. Mgbe afọ abụọ gafechara k´osi Project ghọzịa otu. Kemgbe afọ 2009 ka Josef Bọck werela isi oche ndị otu `Fair und Sensibel´, onye nke sokwa tọọ ntọnala otu nkea, bụrụkwa onyeisi Leutenant Colonel ndị Uweojii nọ na Vienna. Ọ bụ n´afọ 2012 k´otua bidoro ịza `Fair und Sensibel Ọsterreich´.

Ndịọrụ otua na-eji mkpachapụ anya na obi umeala n´enweghị esemokwu, na-arụ ọrụ ha, n´ihe gbasara ndị Amaala, na ndị si obodo ọzọ bịa, nakwa ndị gbatara ọsọ enyemaka. Isi ihe `Fair und Sensibel Ọsterreich´ chọrọ bụ mmadụ iji obi umeela nakwa omume ziri ezi na-eso mmadụ ibe ya, na-agbanyeghị ebe onye ahụ siri bata, m´ọbụ okwukwe ya, m´ọbụ ụcha anụ ahụ ya, m´ọbụ mmekọrịta ahụ ya na onye ọzọ (seịual orientation), m´ọbụ nkwarụ ahụ (physical and mental disabilities) onwere. Site na-enyemaka ndị „Wir-Gefụhls“ ka nchekwa ndị mmadụ bi n´obodo Austrịa nakwa nlekọta ndị mmadụ nwere ike ịgawanye n´ihu. Ọ bụkwa site nrụkọsị ọrụ nke anyị na ndị Uweojii nakwa ndịọrụ ọchịchị obodo na-ahụ maka `minority Contacts´, nke anyị gbakọrọ ọnụ na-arụ n´ime otu nnukwu ụlọ, ka mwekọta (integration) ndị bịara ọhụrụ n´obodo na ndị Amaala jiri nwee ezigbo isi bụrụkwa ihe iji maa atụ.


Ihe esere ese: Eji ihe dị oji dee OIF. N´elu `O´ esere maakị uhie-uhie na makị na-acha ọcha na makị na-acha ọbara ọbara ọzọkwa. N´akụkụ ya ka-edere n´out out Austrian Integration Fund.

N´ebea eji ihe odide ọcha see mmadụ ise, ndị nke ihe na-acha uhie uhie gbara okirikiri.  Ejikwa ihe odide uhie-uhie dee: bmask. N´okpuru ebea ka-eji ihe na-acha nzu nzu wee dee: Ministry na-ahụ maka Ọrụ, Enyemaka (nlekọta ndị chọrọ enyemaka) nakwa Ihe oriri.

Eji ihe na-acha nzu nzu dee: BM.I, n´okpuru ya, eji ihe odide nzu nzu dee: Ministry na-ahụ maka ime obodo. Eji ihe odide nzu nzu see egbe, nke eji ihe odide uhie-uhie see `coat of arms´ n´etiti obi ya.Akwụkwọ asambodo. Esere n´lu ya: Rose flawa nke nọ n´elu ihe na-acha ndụ ndụ. N´okpuru ya, ebe n´eji oji ka-eji ihe ndị odide na-acha odo odo, oroma na ọcha, wee jikwa ihe na-acha ọcha dị icheiche dee: Fair und Sensibel Ọsterreich. N´akụkụ ya ka-esere Austrian Flag.Ịgba egwu n´acha ụlọụlọ (ajaaja - braun). Eji ihe odide na-eji oji, wee see ihe ọgụgụ egwu anọ. N´okpuru ya ka-eji ihe na-acha ọlaedo dee: Ghana Minstrel Choir.