Ahụisike

Foto Onyoonyoo: N´ihu bụ foto osisi nke wepụtara flawa na-acha odo-odo. N´azụ bụ foto na-egosi ọtụtụ flawa ndị ọzọkwa.

Ihe niile gbasara Ahụisike na ka-esi akwụ ụgwọ maka ya, dị n´aka ndị Obodo. N´ebe a ka ị ga-enweta ozi dị icheiche gbasara nke a nakwa ozi na ọkwa ndị ọzọ gbasara ahụisike.

[/headline)]


Ebe nke mbụ kọwara ụdị dị icheiche nakwa ọrụ dị icheiche dị na ´ime ihe gbasara Ihe gbasara Ahụisike (health system) ndị Austrịa.

Ị ga-agụ n´ebe nke abụọ, etu ndị Austrịa siri hazie ihe gbasara mkpuchi ụgwọ Ụlọgwụ  (health insurance coverage) nakwa etu esi akwụ Dọkịta ụgwọ ọrụ ya.

E mechaa ị ga-apị ebe a maka ihe ndị dị mkpa ikwesịrị ịmata mgbe ịchọrọ ịhụ Dọkịta n´obodo Austrịa.

 

Akwụkwọ ebe ndị nwe obodo depụtara aha ndị Dọkita ha niile dị na nke ndị ụlọrụ na-ahụ maka ikpụchi ụgwọ nlekọta ahụ (health insurance). E nwekwara ozi gbasara nke a n´igwe Internet. Leekwa anya na ngwụcha ebe a edere ihe, ị ga-ahụkwa ebe ndị ọzọ edepụtere ebe mmadụ nwere ike i nweta ozi ndị ọzọ.

*Ndị Dọkịta niile ndị nwe obodo nyere ike nakwa ndị na-ahụ maka ikpụchi ụgwọ nlekọta ahụ (health insurance) nwere agba (agreement), nke a pụtara na ndị Dọkịta nakwa ndị ndị na-ahụ maka ikpụchi ụgwọ nlekọta ahụ (health insurance) na-agbakọrọ onwe ha ego (ụgwọ) nlekọta ahụ. Nke a mere na ndị ọrịa anaghị akwụ ụgwọ ọ bụla. Ewezugara ndịọrụ dịka ndịọrụ obodo (civil servants) na nke a.

 

Leekwa anya na ngwụcha ebe a edere ihe, ị ga-ahụ ebe edepụtara aha ụlọgwụ niile dị n´Austrịa.

A na-akwụ ụgwọ mgbe mmadụ chọrọ enyemaka onye Dọkịta. Mana enwekwara ọtụtụ ebe ndị Dọkịta na-elekọta ndịọrịa na anaghị ha ego ọbụla.

Sapee akara Internet ndị dị n´ala ebe a, ị ga-agụ ebe niile mmadụ nwere ike ije, ebe ọ ga-enweta enyemaka ndị Dọkịta na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.

 

 

Links: