Ụlọrụ Ndị Ọchịchị

Foto Onyoonyoo: Faịlụ akwụkwọ na-acha ọcha dị icheiche nakwa ndị na-eji nji, ndị nke edobere n´elu ebe a na-edebe akwụkwọ.

Mgbe ị bịara ọhụrụ, e nwere ọtụtụ ihe ga na-ebuje gị ụlọrụ ndị ọchịchị oge ọ bụla. A ga-enye gị ozi n´ebe a n´ihe gbasara akwụkwọ na-egosi ọnọdụ mmadụ n´obodo (evidence of residence), akwụkwọ eji anya ụgbọala, akwụkwọ na-egosi ebe mmadụ bi nakwa ihe gbasara ndị Uweojii.

Cheta lee anya na ndụmọdụ ndị ọzọ edere n´okpuru ebe a.


Ndụmọdụ gbasara ije n´ụlọrụ ndị ọchịchị

  • Mgbe ị bịara ọhụrụ, ọ ga-abara gị uru ịchọta onye ga-enyere gị aka n´ihe gbasara njem n´ụlọrụ ndị ọchịchị. Ọbụrụ na nke a enweghị isi, otu o sịna dị: ị ga-eme ngwa ngwa ịhụ na-iji aka gị mee ihe niile gbasara ịga n´ụlọrụ ndị na-achị achị.
  • Tụkwasị ndị ụlọrụ obodo Austrịa obi – ọ bụrụgodi na-onwere ihe adịghị mma ndị ụlọrụ ndị nke obodo gị mere gị. Ndịọrụ na-ahụ maka ihe ijiri maka ya bịa, ga-enyere gị aka.
  • Buru n´obi na iwu machibidoro ndịọrụ obodo Austrịa ịnara onyinye ọ bụla maka ọrụ ha. Enwere ike i were ya na inyela onyeọrụ obodo ngarị aka-azụ, m´ọbụrụ na-achọpụta n´inyere ya onyinye. Iwu ga-ejidekwa unu abụọ.
  • Mgbe ị na-aga, ị ga-eji akwụkwọ ezigbo mbụ (original) nakwa ndị mbipụta (copies). Nke a ga-egbochi igbu oge, ọ ga-ebekwara gị ego ibipụta akwụkwọ ọzọ n´ebe ahụ.
  • N´ime akwụkwọ gị ndị kacha mkpa, ị ga-achọ ịgbanwe asụsụ okwu eji dee ya. Gbanwee ha niile ozigbo ịbatara.
  • Ọ bụ naanị ndị na-akọwa okwu, ndị nke obodo nyere ike, ga-agbanwere gị asụsụ dị n´ime akwụkwọ ndị a, ọ bụghị ya, ndị ụlọrụ      ọchịchị a gaghị anabata ya.
  • Ị ga-etinye akwụkwọ gị niile n´otu nnukwu okwụkwọ failụ. Nke a ga-eme k´akwụkwọ gị niile dịrị gị n´aka, k´ịhapụ ichefu nke ọ bụla, mgbe ị na-eje n´ụlọrụ ndị ọchịchị.
  • Hụ na iji akwụkwọ gị niile dị mkpa nọrọ n´obodo Austrịa.

 

Links