Usoro ịgụ akwụkwọ

Ihe esere ese: Esere blakbọdụ emepere emepe na-acha ndụ-ndụ. Na mbido, edere egwu ahụ a na-akpọ „Der Zauberlehrling“, nakwa fọmụla mgbakọ matịmatik nakwa kemịstrị.

Nlekọta Ụmụọtakara

Enwere ụlọ ekewapụtara n´ime ụlọakwụkwọ ụmụọtakara, ebe a na-edobe ụmụọtakara ndị nke n´erubeghị afọ 3. Bido mgbe ha dị afọ 3 rue mgbe ha ga-adị afọ 6, ha ga-anọ n´ụlọakwụkwọ ebe a na-elekọta ụmụọtakara. Nwatakịrị ọ bụla dị afọ 5 ga-ejerịrị ụlọakwụkwọ ọtakara, iji wee kwadoo ya ọvụma maka ọdịnihu. Ọ bụ iwu n´ụmụaka niile nọ n´Austrịa, ndị nke dị afọ 6 rue afọ 15 ga-ejerịrị akwụkwọ.

Ụlọakwụkwọ Elementrị

Ụmụakwụkwọ ndị na-eje elementrị bụ ndị nke dị afọ 6 ruo afọ 10, nke a bụ usoro nke mbụ dị n´ihe gbasara ịgụ akwụkwọ. Ekere akwụkwọ elementrị ụzọ Klasị anọ.

Ụlọakwụkwọ Sekọndrị nakwa Ụlọakwụkwọ Mmụta dị icheiche (nke nta)(Secondary School and General Education High School (lower level)

Ụlọakwụkwọ nke a ka mmadụ ga-abanye ozigbo osiri na Ụlọakwụkwọ elementrị pụta. Ekekwara ya ụzọ Klasị anọ. E nwere ike ị banye Ụlọakwụkwọ Mmụta dị icheiche (nke nta) mgbe mmadụ gafeere ule a na-ele maka ya, m´ọbụ mgbe mmadụ gafeere ọvụma na akwụkwọ elementrị. E nwere Ụlọakwụkwọ a na-akpọkwa `cooperative Middle School´ nke wekọtara ihe a na-akụzi na Sekọndrị nakwa nke ọzọ ọnụ. Ewepụ nke a, enwekwara, n´akụkụ State dị icheiche, Ụlọakwụkwọ ọgba ọhụrụ, nke pụtara ọhụrụ a na-akpọ `New Middle School´.

Ụlọakwụkwọ Polytechnic

Ụlọakwụkwọ Polytechnic bụ klasị nke 9 na-akwụkwọ nke etiti (sekọndrị). Nke a na-akwado mmadụ maka mbido ịmụta ọrụaka. Mgbe agụchara nke a, iwu obodo nke ji mmadụ maka ịgụ akwụkwọ ga-abịa na njedebe.

Ụlọakwụkwọ maka ndị Ọrụaka (vocational, trade, career or technical school)

Nke a bụ usoro ịgụ akwụkwọ nke ọzọ, nke emere maka ndị chọrọ ịmụta udi ọrụaka dị icheiche. A na-agụ akwụkwọ nke a afọ atọ m´ọbụ afọ anọ (na ngwụcha, ị ga-ele ule ọkachamara). E nwekwara Ụlọakwụkwọ Ọrụaka nke kacha elu, nke a na-agụ afọ ise (na ngwụcha, ị ga-ele ule ọkachamara nakwa ule matura (nke dịkwa ka ule WAEC/GCE).

Ụlọakwụkwọ Mmụta dị icheiche (nke kacha elu) (General Education High School (upper level)

A ga-abanye Ụlọakwụkwọ nke a kacha elu, mgbe agụchara nke nta ya. E nwekwara Ụlọakwụkwọ nke ọzọ dịkwa ka nke a, nke a na-akpọ `Oberstufenrealgymnasium´, (m´ọbụ Sekọndrị dị elu pụrụ iche). A na-ebido Akwụkwọ nke a mgbe a gụchara Akwụkwọ nke Sekọndrị nkịtị. A na-aga Ụlọakwụkwọ abụọ ndị a ruo Klasị anọ tupu elee ule `Matura´, (nke dịkwa ka WAEC/GCE).

Ụlọakwụkwọ maka ndị ahụ ezughị oke

Ụlọakwụkwọ nke a bụ maka Ụmụakwụkwọ ndị ahụ ezughị oke, bụkwa ndị chọrọ nnụkwụ enyemaka pụrụ iche. A ga-agụ akwụkwọ nke a ruo oge ahụ iwu kwuru na ọ ga-akwụsị.

Mahadum na Ụlọakwụkwọ dị elu ndịọzọ

Obodo Austrịa nwere Mahadum nakwa Ụlọakwụkwọ ọzụzụ dị elu ndị ọzọ dị icheiche. Tupu mmadụ e nwee ike ịgụ akwụkwọ n´ụlọakwụkwọ ndị a, ọ ga-eji `Matura´ (nke dịka WAEC/GCE), m´ọbụ akwụkwọ ule ọzọ gọsịrị n´ọdị nkwadebe maka ịga ụlọakwụkwọ Mahadum.

 

Quelle: BMASK/BM.I

 

Ndebanye aha maka ịga Akwụkwọ

A ga-edebanye aha ụmụakwụkwọ niile n´ụlọakwụkwọ ọ bụla ha chọrọ ibido ijebe, tupu ekwe ha ka ha bido akwụkwọ. Ị ga-enweta ozi gbasara nke a mgbe ị ga-apị n´Internet ndị Landesschulräte in Ọsterreich.