E nwere ụzọ oge ọrụ abụọ: ezigbo oge ọrụ nakwa oge abụghị oge ọrụ `over-time´.
N´obodo Austrịa ezigbo oge ọrụ bụ awa asatọ n´ime otu ụbọchị, m´ọbụ awa 40 n´ime otu izuụka. Mana e nwere mwezuga dị n´iwu nke a.
Oge ọ bụla gafere oge eji arụ ọrụ a banyela na `over-time´. A na-eji ego m´ọbụ inye mmadụ oge ezumike, akwụghachi ụgwọ `over-time´.
N´ụbọchị ọ bụla, a na-enye mmadụ oge ezumike ruru nkeji 30 mgbe ọ gafere awa isii ọrụrụ ọrụ. A naghị agbakọnye oge ezumike nke a dịka oge ọrụ, anaghịkwa akwụ mmadụ ụgwọ maka ya. A ga-enwerịrị oge ezumike ruru awa iri na otu n´ime ụbọchị niile mmadụ rụrụ ọrụ.
E nwere oge ezumike ruru awa 36 na ngwụcha izu ụka ọ bụla, mana e nwere ihe mwezuga dị n´iwu nke a.
Quelle: BMASK/BM.I
Links
- anwaltarbeitsrecht.com (ebook)