Ịnabata Akwụkwọ Asambodo

Ihe esere ese: Esere okpu na-acha anụnụ-anụnụ nke onye gụchara akwụkwọ Mahadum na-ekpu. Esekwara akwụkwọ asambodo apịakọtara apịakọta nke eji eriri na-acha uhie-uhie kechie n´etiti.

Ịnabata Akwụkwọ Asambodo ndị Ọrụaka

A ga-achọ k´obodo nabata akwụkwọ asambodo nke a, m´ọbụrụ udi ọrụ mmadụ ekwesịghị ịrụ na-ejighị akwụkwọ gosiri na-ọmụrụ udi ọrụaka ahụ. Ihe a na-akpọ udi akaọrụ nke a bụ `akaọrụ echekwara n´udi dị iche´. Mmadụ nwere ike ịrụ udị ọrụaka ndị ọzọ, na-ewetaghị akwụkwọ nnabata asambodo ya.

 Ịnabata Akwụkwọ Asambodo Ụmụakwụkwọ  nakwa nke ndị na-amụ ọrụ (Apprentice)

Tupu anabata akwụkwä asambodo ụmụakwụkwọ na nke ndị na-amụ ọrụ si obodo ọzọ bịa, a ga-ebu ụzọ nyochaa chọpụta mara ma nke ha na ndị obodo Austrịa ọha otu. Ọ bụrụ n´ọhaghị otu, a ga-achọ ka mmadụ lee ule ndị ga-eme ka ha hara otu.

Ọbụ nkwekọrịta obodo n´ibe ya nwere na-egosi udi mkpebi a na-enwe n´ihe gbasara akwụkwọ asambodo ndị gụchara akwụkwọ nakwa nke ndị mụchara Ọrụaka. N´ọtụtụ oge, ndị isi ụlọakwụkwọ dị elu, nke ha chọrọ ịbanye, bụ ndị na-etinyere ha aka nkwado n´ime akwụkwọ asambodo ha.

Ndị na-ahụ maka ịnabata akwụkwọ asambodo ụmụakwụkwọ bụ ndị Federal Ministry nke Education, Arts na Culture, ndị na-ahụ maka ịnabata akwụkwọ asambodo ndị mmadụ nakwa nke ndị mụrụ akaọrụ bụ ndị Federal Ministry nke Economy, ezinụlọ na ndị na-eto eto (okoro na agbọghọ)

Mahadum (Universities)

Ọ bụ mkpa nakwa uru ọ ga-aba maka ịrụ ọrụ, ka a na-elebanye anya mgbe mmadụ tinyere akwụkwọ na-achọ ka anabata akwụkwọ asambodo nke onwetara n´obodo ọzọ. Nke a metụtara naanị akwụkwọ ọmụmụ olemole.

Ndị na-etinye aka nkwado n´ime akwụkwọ asambodo, bụ ụlọakwụkwọ ahụ mmadụ chọrọ ibido gawa, bụkwa ndị na-akụzi otu udi ihe ahụ, ndị ụlọakwụkwọ obodo ọzọ ahụ na-akuzikwa.

Dịka n´ihe gbasara akwụkwọ asambodo ndị gụchara akwụkwọ nakwa nke ndị mụchara Ọrụaka, ọ bụkwa udi nkwekọrịta obodo n´ibe ya nwere na-egosi udi mkpebi a ga-enwe n´ihe gbasara nhamotu (same worth) akwụkwọ ndị ahụ. Ị ga-enweta ozi ndị ọzọ banyere nnabata akwụkwọ asambodo ndị gụchara akwụkwọ nakwa nke ndị mụchara Ọrụaka n´igwe Internet ndị Federal Ministry nke Science na nchọpụta (Research).

 

Quelle: BM.I

 

Links