Achọpụtara n´isi obodo ọzọ, nke anọghị niime Europe m´ọbụ niime Switzerland, bata. Ị chọkwara iji obodo Austria mere ebe obibi gị. Obi dị anyị ụtọ maka anya ịhụrụ obodo anyị, anyị ji obi anyị na-asịkwa gị nnọọ.
Iji wee nọọ nke ọma n´obodo ọhụrụ gị, mmadụ ga-amarịrị iwu na ihe ndị ọzọ dị mkpa e nwere n´obodo ọhụrụ ya bụ Austria. Nke a mere anyị ji depụtere gị iwu ndị a niile nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa i kwesịrị ịma, n´ebe a.
FS Easy Way: Ụzọ dị nso (nkenke) iji nweta ozi m´ọbụ ọkwa dị mkpa.
fs-easyway.at ga-eme ka i nweta ozi si n´ụlọọrụ ndị ọchịchị na-ahụ maka Ọrụ, Ahụisiike, Ọzụzụ (Ụlọ-Akwụkwọ), Ndị-Enyemaka, Ụlọ-Obibi na Ụlọọrụ ndị nwe obodo. Mgbe ọbụla, akwụkwọ ọgụgụ newspaper a na-akpọ Wissen und Werte na-edepụta ihe bara uru dị iche iche mmadụ nwere ike isi n´obodo Austria e nweta, ọ na-edekwa maka etu esi a kpachapụrụ ugwu dịịrị mmadụ anya nakwa uru ọ bara mmadụ ị mata ihe ndịa niile mgbe ọ bịara ọhụrụ.
Mgbe ị batachara n´obodo Austria, e nwere ihe nde dị iche iche ị ga-emerịrị.
N´ebe a ka ị ga-apị aka iji mata ihe mbụ (izizi) ndị a.
Pịa n´ebea ka ịgụọ ihe ndị ọzọ gbasara Easy Way na otu Fair und Sensibel Ọsterreich.
Were akara office@fairundsensibel.at degara ndị otu `Fair und Sensibel Ọsterreich´ akwụkwọ maka ajụjụ ndị ọzọ i nwere ịjụ.